YouVersion Logo
Search Icon

JOSHUA 21

21
1Ndi-isi ulo nke ndi bu nna ndi Livai we biarue nso Eleeza, bú onye-nchu-àjà, biaru kwa nso Joshua nwa Nun, biaru kwa nso ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ebo nile nke umu Israel; 2ha we gwa ha okwu nime Shailo n'ala Kenean, si, Jehova nyere iwu n'aka Moses inye ayi obodo ufọdu ayi gēbi, ha na ebe-ita-nri-ha nke gādiri anu-ulo-ayi. 3Umu Israel we si n'ihe-nketa-ha nye ndi Livai, dika okwu-ọnu Jehova si di, obodo ndia na ebe-ita-nri-ha.
4Ife-nzà we putara ab͕uru nile nke ndi Kohat: umu Eron, bú onye-nchu-àjà, ndi sitere na ndi Livai, we nwe obodo iri na atọ sitere n'ebo Juda, site kwa n'ebo ndi Simeon, site kwa n'ebo Benjamin, n'ife-nzà.
5Umu Kohat fọduru we nwe obodo iri sitere n'ab͕uru nile nke ebo Efraim, site kwa n'ebo Dan, site kwa na nkera ebo Manase, n'ife-nzà.
6Umu Giashon we nwe obodo iri na atọ sitere n'ab͕uru nile nke ebo Isaka, site kwa n'ebo Asha, site kwa n'ebo Naftali, site kwa na nkera ebo Manase nime Beshan, n'ife-nzà.
7Umu Merari dika ab͕uru nile ha si di we nwe obodo iri na abua sitere n'ebo Reuben, site kwa n'ebo Gad, site kwa n'ebo Zebulun.
8Umu Israel we nye ndi Livai obodo ndia na ebe-ita-nri-ha n'ife-nzà, dika Jehova nyere iwu n'aka Moses. 9Ha we si n'ebo umu Juda, si kwa n'ebo umu Simeon, nye obodo ndia nke akpọrọ ha n'aha n'ebe a: 10ha we diri umu Eron, ndi sitere n'ab͕uru ndi Kohat, ndi sitere n'umu Livai: n'ihi na ha ka ife-nzà mbu diri. 11Ha we nye ha Kiriat-aba, nna Anak ka Aba ahu bu, (nke ahu bu Hebron,) n'ugwu Juda, ya na ebe-ita-nri-ya nile buruburu ya. 12Ma ọhia nke obodo ahu, na obodo ntà ya nile, ka ha nyere Keleb nwa Jefune n'ihe-onwunwe-ya.
13Umu Eron, bú onye-nchu-àjà, ka ha nyere Hebron na ebe-ita-nri-ya, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu, na Libna na ebe-ita-nri-ya nile; 14na Jatia na ebe-ita-nri-ya nile, na Eshtemoa na ebe-ita-nri-ya nile, 15na Holon na ebe-ita-nri-ya nile, na Debia na ebe-ita-nri-ya nile; 16na Ain na ebe-ita-nri-ya nile, na Juta na ebe-ita-nri-ya nile, na Bet-shemesh na ebe-ita-nri-ya nile; obodo iteghete site n'ebo abua ahu. 17Site kwa n'ebo Benjamin, Gibeon na ebe-ita-nri-ya nile, na Geba na ebe-ita-nri-ya nile; 18na Anatot na ebe-ita-nri-ya nile, na Almon na ebe-ita-nri-ya nile: obodo anọ. 19Obodo nile nke umu Eron, bú ndi-nchu-àjà, di obodo iri na atọ na ebe-ita-nri-ha.
20Ab͕uru nile nke umu Kohat, bú ndi Livai, bú ndi fọduru site n'umu Kohat, ha nwere obodo ife-nzà-ha site n'ebo Efraim. 21Ha we nye ha Shekem na ebe-ita-nri-ya nile n'ugwu Efraim, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu, na Gezea na ebe-ita-nri-ya nile; 22na Kibzaim na ebe-ita-nri-ya nile, na Bet-horon na ebe-ita-nri-ya nile; obodo anọ. 23Site kwa n'ebo Dan, Elteke na ebe-ita-nri-ya nile, na Gibeton na ebe-ita-nri-ya nile; 24na Ajalon na ebe-ita-nri-ya nile, na Gat-rimon na ebe-ita-nri-ya nile; obodo anọ. 25Site kwa na nkera ebo Manase, Tanak na ebe-ita-nri-ya nile, na Gat-rimon na ebe-ita-nri-ya nile; obodo abua. 26Obodo nile di iri, ha na ebe-ita-nri-ha, bú nke diri ab͕uru umu Kohat fọduru.
27Ha nye-kwa-ra umu Giashon, ndi sitere n'ab͕uru ndi Livai, Golan nime Beshan na ebe-ita-nri-ya nile, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu; na Be-eshtera na ebe-ita-nri-ya nile, site na nkera ebo Manase; obodo abua. 28Site kwa n'ebo Isaka, Kishion na ebe-ita-nri-ya nile, na Daberat na ebe-ita-nri-ya nile; 29na Jamut na ebe-ita-nri-ya nile, na En-ganim na ebe-ita-nri-ya nile, obodo anọ. 30Site kwa n'ebo Asha, Mishal na ebe-ita-nri-ya nile, na Abdon na ebe-ita-nri-ya nile; 31na Helkat na ebe-ita-nri-ya nile, na Rehob na ebe-ita-nri-ya nile; obodo anọ. 32Site kwa n'ebo Naftali, Kedesh nime Galili na ebe-ita-nri-ya nile, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu, na Hamot-doa na ebe-ita-nri-ya nile, na Katan na ebe-ita-nri-ya nile; obodo atọ. 33Obodo nile nke ndi Giashon, dika ab͕uru nile ha si di, di obodo iri na atọ na ebe-ita-nri-ha.
34Ha nye-kwa-ra ab͕uru nile nke umu Merari, bú Livai fọduru, Jokneam na ebe-ita-nri-ya nile; na Kata na ebe-ita-nri ya nile, 35na Dimna na ebe-ita-nri-ya nile, na Nahalal na ebe-ita-nri-ya nile, sitere n'ebo Zebulun; obodo anọ. 36Site kwa n'ebo Reuben, Beza na ebe-ita-nri-ya nile, na Jehaz na ebe-ita-nri-ya nile, 37na Kedimot na ebe-ita-nri-ya nile, na Mefaat na ebe-ita-nri-ya nile; obodo anọ. 38Site n'ebo Gad, Remot nime Gilead na ebe-ita-nri-ya nile, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu, na Mahanaim na ebe-ita-nri-ya nile; 39na Heshbon na ebe-ita-nri-ya nile, na Jeza na ebe-ita-nri-ya nile; obodo ahu nile di anọ. 40Obodo ahu nile diri umu Merari dika ab͕uru nile ha si di, bú ndi fọduru site n'ab͕uru nile nke ndi Livai; ihe-ife-nzà-ha we di obodo iri na abua.
41Obodo nile nke ndi Livai n'etiti ihe-onwunwe umu Israel di ọgu obodo abua na asatọ na ebe-ita-nri-ha. 42Obodo ndia di otú a, obodo ọ bula na ebe-ita-nri-ya nile buruburu ya: otú a ka ọ diri obodo ndia nile.
43Jehova we nye Israel ala ahu nile nke Ọ ṅuru iyi inye ndi bu nna-ha; ha we nweta ya, we biri nime ya. 44Jehova we me ka ha zuru ike buruburu, dika ihe nile si di nke Ọ ṅuru ndi bu nna-ha iyi: ọ dighi kwa nwoke ọ bula n'etiti ndi-iro-ha nile guzoro n'iru ha; ndi-iro-ha nile ka Jehova nyere n'aka-ha. 45Ọ dighi ihe ọ bula dapuru n'ezi ihe nile nke Jehova gwara ulo Israel; ha nile mere.

Currently Selected:

JOSHUA 21: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy