YouVersion Logo
Search Icon

JENESIS 46

46
1Israel we bulie ije, ya na ndi nile o nwere, ọ biarue Bia-sheba, chuara Chineke nke nna-ya Aisak aja. 2Chineke we gwa Israel okwu n'ọhù nke abali, si, Jekob, Jekob. Ọ si Lekwam. 3Ọ si, Mu onwem bu Chineke, bú Chineke nke nna-gi: atula egwu irida n'Ijipt; n'ihi na mba uku ka M'gēme gi ka i ghọ n'ebe ahu. 4Mu onwem gēso gi rida n'Ijipt; ọ bu kwa Mu onwem gēme ka i rigota kwa n'ezie: Josef gātukwasi kwa aka-ya n'anya-gi abua. 5Jekob we si na Bia-sheba bilie: umu Israel we buru Jekob, bú nna-ha, na umu-ntakiri-ha, na nwunye nile ha, n'ub͕ọ-ala nke Fero zitereri ibu ya. 6Ha chiri anu-ulo-ha, na àkù-ha, bú nke ha kpatarari n'ala Kenean, bata n'Ijipt, bú Jekob na nkpuru-ya nile tiyere onwe-ya: 7ya na umu-ya ndikom, na umu-ndikom nke umu-ya ndikom, umu-ya ndinyom, na umu-ndinyom nke umu-ya ndikom, ọ bu nkpuru-ya nile ka o mere ka ha so ya bata n'Ijipt.
8Ma ndia bu aha umu Israel, ndi batara n'Ijipt, Jekob na umu-ya ndikom: ọkpara Jekob, bú Reuben. 9Umu-ndikom Reuben; Hanok, na Palu, na Hezron, na Kami. 10Umu-ndikom Simeon; Jemuel, na Jamin, na Ohad, na Jakin, na Zoba, na Shaul, bú nwa nke nwayi Kenean ahu. 11Umu-ndikom Livai; Giashon, na Kohat, na Merari. 12Umu-ndikom Juda; Ia, na Onan, na Shila, na Perez, na Zera: ma Ia na Onan nwuru n'ala Kenean. Umu-ndikom Perez bu kwa Hezron, na Hamul. 13Umu-ndikom Isaka; Tola, na Puva, na Job, na Shimron. 14Umu-ndikom Zebulun: Sered, na Ilon, na Jahleel. 15Ndia bu umu-ndikom Lia, nke ọ muru nye Jekob nime Padan-eram, ha na Daina, bú nwa-ya nwayi nkpuru-obi nile nke umu-ya ndikom na umu-ya ndinyom bu orú na iri na atọ 16Umu-ndikom Gad; Zifyon, na Hagi, na Shuni, na Ezbon, na Iri, na Arodi, na Areli. 17Umu-ndikom Asha; Imna, na Ishva, na Ishvi, na Beria, na Sera, bú nwa-nne-ha nwayi: umu-ndikom Beria kwa; Heba na Malkiel. 18Ndia bu umu-ndikom Zilpa, onye Leban nyere Lia nwa-ya nwayi, ọ we muara Jekob ndia, bú nkpurui-obi iri na isi. 19Umu-ndikom Rechel, bú nwunye Jekob; Josef na Benjamin. 20Ewe muara Josef n'ala Ijipt Manase na Efraim, ndi Asenat, bú nwa-nwayi Poti-fera onye-nchu-àjà nke On, muru nye ya. 21Umu-ndikom Benjamin; Bela na Beka, na Ashbil, na Gira, na Neaman, na Ihi, na Rosh, na Mupim, na Hupim, na Ad. 22Ndia bu umu-ndikom Rechel, ndi amuru nye Jekob: nkpuru-obi nile di iri na anọ. 23Umu-ndikom Dan; Hushim. 24Umu-ndikom Naftali; Jahzeel, na Guni, na Jiza, na Shilem. 25Ndia bu umu-ndikom Bilha, onye Leban nyere Rechel nwa-ya nwayi, ọ we muara Jekob ndia: nkpuru-obi nile di asa. 26Nkpuru-obi nile Jekob nwere ndi batara n'Ijipt, ndi siri n'úkwù-ya puta, nāgughi nwunye nile nke umu Jekob, nkpuru-obi nile di ọgu atọ na isi; 27umu-ndikom Josef, ndi amuru nye ya n'Ijipt, di kwa nkpuru-obi abua; nkpuru-obi nile nke ulo Jekob, ndi nābata n'Ijipt, di ọgu atọ na iri.
28Ma ọ bu Juda ka o zigara n'iru ya jekuru Josef, igosi ya uzọ n'iru ya rue Goshen; ha we bata n'ala Goshen 29Josef we dozie ub͕o-ala-ya, rigorue Goshen izute Israel, bú nna-ya; ọ me ka ọ hu ya anya, ọ we dakwasi ya n'olu, kwa ákwá n'olu-ya mb͕e di anya. 30Israel we si Josef, Ka m'nwua ub͕u a, mb͕e m'husiri iru-gi, na i nọ ndu rue ub͕u a. 31Josef we si umu-nne-ya, si kwa ulo nna-ya, M'gārigo, gosi Fero, si ya, Umu-nnem na ulo nnam, ndi nọ n'ala Kenean, abiakutewom; 32ma ndikom ahu bu ndi-ọzùzù ìgwè ewu na aturu, n'ihi na ndi ọlu-ha bu iche anu-ulo ka ha bu-woro; ọ bu kwa ìgwè ewu na aturu-ha na ìgwè ehi-ha, na ihe nile ha nwere, ka ha chitaworo. 33Ma o gēru, mb͕e Fero gākpọ unu, si kwa, Gini bu ọlu unu nālu? 34na unu gāsi, Ndi ọlu-ayi bu iche anu-ulo ka ndi orù-gi buworo site na mb͕e ayi di na nwata we rue ub͕u a, ma ayi onwe-ayi, ma nna-ayi-hà: ka unu we biri n'ala Goshen; n'ihi na onye ọ bula nāzù ìgwè ewu na aturu bu ihe-árú n'anya ndi Ijipt.

Currently Selected:

JENESIS 46: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy