YouVersion Logo
Search Icon

JENESIS 36

36
1Ma ndia bu osuso-ọmumu Isọ (nke ahu bu Edom). 2Isọ luru ndinyom-ya site n'umu-ndinyom Kenean; Eda nwa-nwayi Ilon onye Het, na Ọhọlibama nwa-nwayi Ana, bú nwa-nnanyi Zibeon onye-Haivait; 3na Basemat nwa-nwayi Ishmael, nwa-nne-nwayi Nebaiot. 4Eda we muara Isọ Elifaz; Basemat mukwara Reuel; 5Ọhọlibama mu-kwa-ra Jeush, na Jalam, na Kora: ndia bu umu-ndikom Isọ, nke amuru nye ya n'ala Kenean. 6Ma Isọ chiri ndinyom-ya, na umu-ya ndikom, na umu-ya ndinyom, na madu nile nke ulo-ya, na anu-ulo-ya, na anumanu-ya, na ihe nile ọ nwetara, nke ọ kpatarari n'ala Kenean; ọ we si n'iru Jekob, bú nwa-nne-ya, je ala ọzọ. 7N'ihi na àkù-ha riri nne kari ibikọ n'otù nke ọnọdu-ọbìa-ha nile apughi kwa inagide ha n'ihi anu-ulo-ha. 8Isọ we biri n'ugwu Sia: Isọ bu Edom. 9Ma ndia bu osuso-ọmumu Isọ, nna Edom, n'ugwu Sia. 10Ndia bu aha umu-ndikom Isọ: Elifaz nwa Eda nwunye Isọ, Reuel nwa Basemat nwunye Isọ. 11Umu-ndikom Elifaz bu Timan, na Oma, na Zefo, na Gatam, na Kenaz. 12Timna bukwara Elifaz nwa Isọ iko-nwayi; ọ muara Elifaz Amalek: ndia bu umu-ndikom Eda nwunye Isọ. 13Ndia bu kwa umu-ndikom Reuel; Nahat, na Zera, na Shama, na Miza: ndia bu umu-ndikom Basemat nwunye Isọ. 14Ndia bu kwa umu-ndikom Ọhọlibama nwa-nwayi Ana, bú nwa-nwayi Zibeon, nwunye Isọ: o we muara Isọ Jeush, na Jalam, na Kora. 15Ndia bu ndi-isi nke umu Isọ: umu-ndikom Elifaz ọkpara Isọ; Timan onye-isi, Oma onye-isi, Zefo onye-isi, Kenaz onye-isi. 16Kora onye-isi, Gatam onye-isi, Amalek onye-isi: ndia bu ndi-isi Elifaz n'ala Edom; ndia bu umu-ndikom Eda. 17Ndia bu kwa umu-ndikom Reuel nwa-nwoke Isọ; Nahat onye-isi, Zera onye-isi, Shama onye-isi, Miza onye-isi: ndia bu ndi-isi Reuel n'ala Edom; ndia bu umu-ndikom Basemat nwunye Isọ. 18Ndia bu kwa umu-ndikom Ọhọlibama nwunye Isọ; Jeush onye-isi, Jalam onye-isi, Kora onye-isi: ndia bu ndi-isi Ọhọlibama nwa-nwayi Ana, nwunye Isọ. 19Ndia bu umu Isọ, ndia bu kwa ndi-isi-ha: nke ahu bu Edom.
20Ndia bu umu-ndikom Sia onye Hoa, ndi bi n'ala ahu; Lotan, na Shobal, na Zibeon, na Ana, 21na Dishon, na Iza Dishan: ndia bu ndi-isi ndi Hoa, umu Sia n'ala Edom. 22Umu-ndikom Lotan bu Hori na Himam; nwanne-nwayi Lotan bu kwa Timna. 23Ndia bu kwa umu-ndikom Shobal; Alvan, na Manahat, na Ibal, na Shefo, na Onam. 24Ndia bu kwa umu-ndikom Zibeon; Aia, na Ana: onye ahu bu Ana onye hutara isi-iyi nke miri di ọku n'ọzara, mbe ọ nāzù inyinya-ibu Zibeon, bú nna-ya, nwere. 25Ndia bu kwa umu-ndikom Ana; Dishon, na Ọhọlibama nwa-nwayi Ana. 26Ndia bu kwa umu-ndikom Dishon; Hemdan, na Eshban, na Itran, na Keran. 27Ndia bu umu-ndikom Iza; Bilhan, na Zaavan, na Akan. 28Ndia bu umu-ndikom Dishan; Uz, na Aran. 29Ndia bu ndi-isi ndi Hoa; Lotan onye-isi, Shobal onye-isi, Zibeon onye-isi, Ana onye-isi, 30Dishon onye-isi, Iza onye-isi, Dishan onye-isi: ndia bu ndi-isi ndi Hoa, dika ndi-isi-ha si di n'ala Sia.
31Ndia bu eze ndi bu eze n'ala Edom, tutu eze ọ bula bu eze umu Israel. 32Bela nwa Beoa bu eze n'Edom; aha obodo-ya bu Dinhaba. 33Bela we nwua, Jobab nwa Zera, nke sitere na Bozra, we buru eze n'ọnọdu ya. 34Jobab we nwua, Husham, nke sitere n'ala ndi Timan, we buru eze n'ọnọdu ya. 35Husham we nwua, Hedad nwa Bedad, onye tib͕uru Midian n'ọhia Moab, we buru eze n'ọnọdu ya: aha obodo-ya bu Avit. 36Hedad we nwua, Samla, nke sitere na Masrika, we buru eze n'ọnọdu ya. 37Samla we nwua, Shaul, nke sitere na Rehobot n'usọ Osimiri, we buru eze n'ọnọdu ya. 38Shaul we nwua, Beal-hanan nwa Akboa we buru eze n'ọnọdu ya. 39Beal-hanan nwa Akboa we nwua, Heda we buru eze n'ọnọdu ya: aha obodo-ya bu Pau; aha nwunye-ya bu Mehetabel nwa Matred, bú nwa-nwayi Me-zahad. 40Ndia bu kwa aha ndi-isi Isọ, dika ab͕uru nile ha si di, dika ebe nile si di, n'aha nile ha; Timna onye-isi, Alva onye-isi, Jetet onye-isi; 41Ọhọlibama onye-isi, Ila onye-isi, Pinon onye-isi; 42Kenaz onye-isi, Timan onye-isi, Mibza onye-isi; 43Magdiel onye-isi, Iram onye-isi: ndia bu ndi-isi Edom, dika ebe-obibi-ha si di n'ala onwunwe-ha. Onye ahu bu Isọ nna Edom.

Currently Selected:

JENESIS 36: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy