YouVersion Logo
Search Icon

JENESIS 34

34
1Daina, bú nwa-nwayi Lia, nke ọ muru nye Jekob, we pua ihu umu-ndinyom ala ahu. 2Shekem, bú nwa-nwoke Hemoa onye-Haivait, onye-isi ala ahu, we hu ya; o kuru ya, dinayere ya, weda ya n'ala. 3Nkpuru obi ya we rapara n'aru Daina nwa-nwayi Jekob, ọ hu nwa-ab͕oghọ ahu n'anya, gwa nwa-ab͕ọghb͕ọ ahu okwu nābà ya n'obi. 4Shekem we gwa nna-ya Hemoa okwu, si, Lutaram nwata-nwayi a na nwunye. 5Ma Jekob nuru na o merururi Daina nwa-ya nwayi; ma umu-ya ndikom nọyere anu-ulo-ya n'ọhia: Jekob we b͕a nkiti rue mb͕e ha biara. 6Hemoa, bú nna Shekem, we pukuru Jekob ikpayere ya uka. 7Umu-ndikom Jekob we si n'ọhia bata mb͕e ha nuru ya: ọ nēwuta ndikom ahu, ha nēwe iwe di ọku nke-uku, n'ihi na ọ bu ihe-nzuzu ka o mere n'Israel, n'idinayere nwa-nwayi Jekob; nke nēkwesighi ime otú a. 8Hemoa we kpayere ha uka, si, Shekem, bú nwam, nkpuru-obi-ya nāhu nwa-unu nwayi n'anya si-ike: biko, werenu ya nye ya na nwunye. 9Ka ayi na unu nālurita kwa nwunye; nyenu ayi umu-unu ndinyom, kurukwanu umu-ayi ndinyom n'onwe-unu. 10Ayi na unu gēbi kwa: ala nka gādi n'iru unu; birinu nāzukwanu ahia nime ya, nwe-kwa-nu ihe-onwunwe nime ya. 11Shekem we si nna Daina, ọ si kwa umu-nne-ya, Ka m'huta amara n'iru unu, ihe unu gāsikwam m'gēnye. 12Me ka ọ ba uba nke-uku n'isim, bú ego-ilu-nwunye na onyinye, m'gēnye dika unu gāsim, ma nyenum nwa-ab͕ọghọ ahu na nwunye. 13Umu-ndikom Jekob we were aghughọ za Shekem na Hemoa nna-ya, we kwue, n'ihi na ọ meruru Daina nwa-nne-ha, 14ha we si ha, Ayi apughi ime ihe a, iwere nwa-nne-ayi nwayi nye nwoke nke anēbighi úgwù; n'ihi na ihe-ita-uta ka ọ buru ayi: 15ọ bu nání ma asi na unu eme nka ka ayi gēkwere unu: ọ buru na unu gādi ka ayi, ka ebìe nwoke ọ bula n'etiti unu úgwù; 16ayi gēnye kwa unu umu-ayi ndinyom, ọ bu kwa umu-unu ndinyom ka ayi gēkuru n'onwe-ayi, ayi na unu gēbi kwa, ghọ otù ndi. 17Ma ọ buru na unu agaghi-ege ayi nti, ka ebìe unu úgwù; ayi gēkuru kwa nwa-ayi nwayi, la. 18Okwu-ha nile we di nma n'anya Hemoa, na n'anya Shekem, bú nwa Hemoa. 19Okorọbia ahu alaghi kwa azu ime ihe ahu, n'ihi na ihe nwa-nwayi Jekob tọrọ ya utọ: ya onwe-ya nwekwara nsọpuru kari ulo nile nke nna-ya. 20Hemoa na Shekem nwa-ya we bia n'ọnu-uzọ-ama obodo-ha, gwa ndikom obodo-ha okwu, si, 21Ndikom ndia, ndi-udo ka ha bu n'etiti ayi; ka ha biri kwa n'ala-ayi, zu kwa ahia nime ya; ala-ayi-kwa, le, ọ sara mbara n'aka abua n'iru ha; ka ayi lutara onwe-ayi umu-ha ndinyom na nwunye, ka ayi nye kwa ha umu-ayi ndinyom. 22Ọ bu nání ma asi na ayi eme nka ka ndikom ahu gēkwere ayi ka ayi na ha biri, ighọ otù ndi, ọ buru na ebìe nwoke, ọ bula n'etiti ayi úgwù, dika ha onwe-ha bu ndi ebiri úgwù. 23Anu-ulo-ha, na ihe ha nwetara, na anumanu-ha nile, ọ̀ bughi ayi gēnwe ha? ka ayi me nání nka, ka ayi kwere ha, ayi na ha gēbi kwa. 24Ndi nile ndi si n'ọnu-uzọ-ama obodo-ya nāpu we ge Hemoa, ge kwa Shekem nwa-ya, nti; ewe bìe nwoke ọ bula úgwù, ndi nile ndi si n'ọnu-uzọ-ama obodo-ya nāpu. 25O rue n'ubọchi nke-atọ, mb͕e o nēb͕u ha nb͕u, na madu abua n'etiti umu-ndikom Jekob, bú Simeon na Livai, umu-nne Daina, were mma-agha-ha n'otù n'otù, biakwasi obodo ahu mb͕e ọ di na ntukwasi-obi, ha we b͕ue ndikom nile. 26Hemoa na Shekem nwa-ya ka ha b͕u-kwa-ra n'ọnu mma-agha, ha we kuputa Daina n'ulo Shekem, pua. 27Umu-ndikom Jekob biakwasiri ndi eb͕uru eb͕u, luta obodo ahu n'agha, n'ihi na ha merururi nwa-nne-ha nwayi. 28Ìgwè ewu na aturu-ha na ìgwè ehi-ha na inyinya-ibu nile ha, na ihe nke di n'obodo ahu, na ihe nke di n'ohia-ya, ka ha chiri; 29àkù-ha nile, na umu-ntakiri-ha nile, na ndinyom-ha, ka ha dọtara n'agha, luta kwa ha n'agha, bú ihe nile nke di n'ulo-ha. 30Jekob we si Simeon na Livai, Unu emekpawom aru, n'imem ka m'sì ísì n'etiti ndi bi n'ala nka, n'etiti ndi Kenean, na n'etiti ndi-Perizait: mu onwem kwa, ebe m'nwere ndikom ole-na-ole, ha gāchikọta onwe imegidem, tigbue m, agēme kwa ka m'tọb͕ọrọ n'efu, mu onwem na ulom 31Ha we si, Ọ̀ gēme nwa-nne-ayi nwayi dika anēme nwayi nākwa iko?

Currently Selected:

JENESIS 34: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy