YouVersion Logo
Search Icon

JENESIS 19

19
1Abua nime ndi-mọ-ozi ahu we biarue Sọdọm n'anyasi; ma Lot nānọdu n'ọnu-uzọ-ama Sọdọm: Lot we hu ha anya, bilie izute ha, ọ da kpue iru-ya n'ala, 2si, Biko, le, ndi-nwem, biko, sinu n'ije-unu wezuga onwe-unu bà n'ulo orù-unu, nọ ọnọdu-abali, sa kwa ukwu-unu, unu gēbili n'isi-ututu, la, Ha si, É-è, kama ọ bu n'amá ka ayi gānọ ọnọdu-abali. 3O rugide ha nke-uku; ha we si n'ije-ha wezuga onwe-ha jekuru ya, ba n'ulo-ya; O we mere ha oké oriri, sie achicha ekoghi-eko, ha rie. 4Ma tutu ha edina, ndikom obodo ahu, bú ndikom Sọdọm, b͕ara ulo ahu buru-buru, ma okorọbia ma agadi, ndi ala ahu nile site n'akuku ọ bula; 5ha we kpọ Lot òkù, si ya, Òle ebe ha nọ, bú ndikom ndi bakutere gi n'abali a? me ka ha putakute ayi, ka ayi we mara aru-ha. 6Lot we pukuru ha rue ọnu-uzọ, mechie uzọ n'azu ya. 7Ọ si, Biko, umu-nnem, unu emela ihe ọjọ. 8Biko, le, enwerem umu-ndinyom abua ndi akāmaghi aru nwoke: biko, ka m'kuputara unu ha, me-kwa-nu ha dika ọ di nma n'anya-unu: nání unu emela ndikom ahu ihe; n'ihi na ọ bu n'ihi nka ka ha biara n'okpuru ndò nke ulom. 9Ha si, Pua n'uzọ. Ha si kwa, Otù onye a batara inọ dika ọbia, ọ we nēkpe ikpe nke ukwu: ub͕u a ayi gēme gi ihe kari ihe ayi gēme ha. Ha we rugide nwoke ahu, bú Lot, nke-uku, biarue nso itiwa ibo-uzọ. 10Ndikom ahu we setipu aka-ha, me ka Lot bakute ha n'ulo, ha we mechie uzọ. 11Ha we were ikpu-ìsì tie ndikom ahu ndi nọ n'ọnu-uzọ ulo, ma onye ntà ma onye uku: ike we gwu ha ichọta ọnu-uzọ ahu. 12Ndikom ahu we si Lot, Ọ̀ di onye i nwere n'ebe a ọzọ? di nwa-gi, na umu-gi ndikom, na umu-gi ndinyom, na onye ọ bula i nwere n'obodo a; me ka ha si n'ebe a pua: 13n'ihi na ndi nēbibi ebe a ka ayi bu, n'ihi na iti-nkpu-ha aghọwo ihe uku n'iru Jehova; Jehova ezitewo kwa ayi ibibi ya. 14Lot we pua, gwa di umu-ya, ndi nālu umu-ya ndinyom, okwu, si, Bilienu, si n'ebe a pua; n'ihi na Jehova nēbibi obodo a. Ma ọ di ka onye nākwa emò n'anya di umu-ya. 15Ma mb͕e chi bọrọ, ndi-mọ-ozi ahu nukpọrọ Lot, si, Bilie, chiri nwunye-gi, na umu-gi ndinyom abua ndi ahuru n'ebe a; ka ewe ghara ikpochapu gi n'ahuhu ajọ omume obodo a. 16Ma ọ b͕agwojuru ya anya; ndikom ahu we jide aka-ya, jide kwa aka nwunye-ya, jide kwa aka umu-ya ndinyom abua; n'ihi na Jehova nwere ọmiko n'aru ya: ha we me ka ọ puta, me ka ọ nọdu n'azu obodo. 17O rue, mb͕e ha mesiri ka ha puta n'azu obodo, na ọ siri, Wepuga onwe-gi n'ihi ndu-gi; elekwala anya n'azu gi, eguzokwala na Gburugburu-ala a nile; wepuga onwe-gi je ugwu ahu, ka ewe ghara ikpochapu gi. 18Lot we si ha, É-è, biko, onye-nwem: 19biko, le, orù-gi ahutawo amara n'iru gi, i mewo kwa ka ebere-gi di uku, nke i meworom n'idebem ndu; mu onwem apughi kwa iwepuga onwem je ugwu, ka ihe ọjọ ahu we ghara irapara n'arum, m'we nwua: 20biko, le, obodo a di nso ib͕alaga n'ebe ahu, nke ahu bu kwa obodo ntà: biko, ka m'wepuga onwem je ebe ahu, (ọ̀ bughi obodo ntà?) nkpuru-obim gādi kwa ndu. 21Ọ si ya, Le, m'huwo kwa gi iru-ọma n'okwu a, na m'gaghi-akwatu obodo a nke i kwuworo okwu bayere ya. 22Me ngwa, wepuga onwe-gi je ebe ahu; n'ihi na apughm ime ihe rue mb͕e i gābà n'ebe ahu. N'ihi nka ka akpọrọ aha obodo ahu Zoa. 23Anyanwu awawo n'elu uwa mb͕e Lot batara nime Zoa. 24Jehova we me ka brimstone na ọku si n'elu-igwe zokwasi Sọdọm na Gọmọra dika miri site n'ebe Jehova nọ; 25O we kwatue obodo ndia, na Buruburu-ala ahu nile, na ndi nile bi n'obodo ahu nile, na ihe-opupú nke ala. 26Ma nwunye-ya siri n'azu Lot leghachi anya n'azu, we ghọ ogidi nnú. 27Abraham we bilie n'isi-ututu je ebe ahu nke o guzorori n'iru Jehova: 28ọ le anya n'ebe Sọdọm na Gọmọra di, na n'ebe ala nile nke Buruburu-ala ahu di, ọ we hu, ma, le, anwuru-ọku nke ala ahu rigoro dika anwuru-ọku nke oké ọku.
29O rue, mb͕e Chineke bibiri obodo nile nke Buruburu-ala ahu, na Chineke chetara Abraham, we si n'etiti nkwatu ahu zipu Lot, mb͕e Ọ kwaturu obodo nke Lot biri nime ha.
30Lot we si na Zoa rigo, biri n'ugwu ahu, ya na umu-ya ndinyom abua; n'ihi na ọ turu egwu ibi nime Zoa: ọ we biri n'ọb͕à, ya onwe-ya na umu-ya ndinyom abua. 31Ada we si nke-ntà, Nna-ayi aghọwo agadi, ma ọ dighi nwoke n'uwa ibakute ayi, dika uzọ uwa nile si di: 32bia, ka ayi me nna-ayi ka ọ ṅua manya-vine, ka ayi na ya dina kwa, ka ayi we site na nna-ayi debe nkpuru ndu. 33Ha we me ka nna-ha ṅua manya-vine n'abali ahu: ada we ba, ya na nna-ya we dina; ma nna-ya amaghi mb͕e o dinara, na mb͕e o biliri. 34O rue n'echi-ya, na ada siri nke-ntà, Le, mu na nnam dinara n'abali nyahuru: ka ayi me ka ọ ṅu kwa manya-vine n'abali a; gi ba kwa, gi na ya dina, ka ayi we site na nna-ayi debe nkpuru ndu. 35Ha we me ka nna-ha ṅu kwa manya-vine n'abali ahu: nke-ntà we bilie, ya na nna-ya we dina; ma nna-ya amaghi mb͕e o dinara, na mb͕e o biliri. 36Umu Lot ndinyom abua we turu ime site n'aka nna-ha. 37Ada we mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Moab: onye ahu bu nna ndi Moab rue ta. 38Nke-ntà kwa, ya onwe-ya mu-kwa-ra nwa-nwoke, kpọ aha-ya Ben-ami: onye ahu bu nna umu Amon rue ta.

Currently Selected:

JENESIS 19: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy