YouVersion Logo
Search Icon

JENESIS 12

12
1Jehova we si Abram, Si n'ala-gi, si kwa n'umu-nna-gi, si kwa n'ulo nna-gi, je nke gi rue ala ahu nke M'gēme ka i hu ya anya: 2M'gēme kwa gi ka i ghọ mba uku, M'gāgọzi kwa gi, me ka aha-gi di uku; gi buru kwa ngọzi: 3M'gāgọzi kwa ndi nāgọzi gi, ọ bu kwa onye nākọcha gi ka M'gābu ọnu: agāgọzi kwa ab͕uru nile nke uwa nime gi. 4Abram we je, dika Jehova gwara ya okwu; Lot we so ya je: Abram b͕ara ọgu arọ atọ na iri na ise mb͕e o siri na Heran pua. 5Abram we chiri Serai, bú nwunye-ya, na Lot, bú nwa nwa-nne-ya, na àkù-ha nile nke ha kpatarari, na madu ndi ha nwetarari nime Heran; ha we pua ije ala Kenean; ha we ba n'ala Kenean. 6Abram we gabiga n'ala ahu rue ebe Shekem, rue osisi terebinth nke More. Ndi Kenean nọ n'ala ahu mb͕e ahu. 7Jehova we me ka Abram hu Ya anya, Ọ si, Nkpuru-gi ka M'gēwere ala nka nye: ọ we wuere Jehova, bú Onye ahu Nke mere ka ọ hu Ya anya, ebe-ichu-aja n'ebe ahu. 8Ọ we si n'ebe ahu kwapu je ugwu ahu di n'Iru-anyanwu Bet-el, ọ ma ulo-ikwū-ya, Bet-el di n'Ọdida-anyanwu, Ai di n'Iru-anyanwu: o wuere Jehova ebe-ichu-aja n'ebe ahu, kpọkue aha Jehova. 9Abram we bulie ije, nēje nēbuli kwa ije n'uzọ Negeb.
10Oké unwu we di n'ala ahu: Abram we ridarue Ijipt inọ n'ebe ahu dika ọbìa; n'ihi na oké unwu ahu di ike n'ala. 11O rue, mb͕e ọ biaruru nso iba n'Ijipt, na ọ siri Serai, bú nwunye-ya, Biko, le, amaram na nwayi mara nma ile anya ka i bu: 12O gēru kwa, mb͕e ndi Ijipt gāhu gi, na ha gāsi, Nwunye-ya ka nwayi a bu: ha ewe b͕uem, ma gi ka ha gēdebe ndu. 13Biko, si na ọ bu nwa-nnem nwayi ka i bu: ka ọ we dirim nma n'ihi gi, ka nkpuru-obim we di kwa ndu n'ihi gi. 14O rue, mb͕e Abram batara n'Ijipt, na ndi Ijipt huru nwayi ahu na nwayi mara nma nke-uku ka ọ bu. 15Ndi-isi Fero we hu ya, too ya n'iru Fero: ewe kubata nwayi ahu n'ulo Fero. 16Ọ we me Abram nke-ọma n'ihi ya: ọ we nwe ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, na oke-inyinya-ibu, na ndi-orù ndikom, na ndinyom nēje ozi, na nne-inyinya-ibu, na kamel. 17Ma Jehova were ihe-ọjọọ uku di iche iche tie Fero na ulo-ya n'ihi okwu bayere Serai, bú nwunye Abram. 18Fero we kpọ Abram, si, Gini bu nka i meworom? n'ìhi gini ka a nēgosighm na nwunye-gi ka ọ bu? 19N'ihi gini ka i siri, Nwa-nnem nwayi ka ọ bu? m'we luta ya n'onwem na nwunye: ma ub͕u a, le nwunye-gi, kuru ya, la. 20Fero we nye ndikom ufọdu iwu bayere ya: ha we zilaga ya na nwunye-ya na ihe nile nke ọ nwere.

Currently Selected:

JENESIS 12: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy