YouVersion Logo
Search Icon

ỌPUPU 2

2
1Otù nwoke nke sitere n'ulo Livai we je luru nwa-nwayi Livai na nwunye. 2Nwayi ahu we turu ime, mua nwa-nwoke: mb͕e ọ huru ya na nwa mara nma ka ọ bu, o zobe ya ọnwa atọ. 3Ọ pughi kwa izobe ya ọzọ, ọ we meere ya ub͕ọ papyrus, were kwa bitumen na pitch te ya; o we tiye nwa ahu nime ya, tiye ya n'etiti ami n'usọ osimiri Nail. 4Nwa-nne-ya nwayi we guzo onwe-ya n'ebe di anya, imara ihe gēme ya. 5Nwa-nwayi Fero we ridata isa aru n'osimiri Nail; umu-ab͕ọghọ-ya we nējeghari n'akuku osimiri Nail ahu; o we hu ub͕ọ ahu n'etiti ami, zìe orù-ya nwayi iweta ya. 6O we meghe ya, hu nwa ahu, ma, le, ọ bu nwata-nwoke nākwa ákwá. O we nwe ọmiko n'aru ya, si, Otù nime umu ndi-Hibru ka nka bu. 7Nwa-nne-ya nwayi we si nwa-nwayi Fero, #M'gēje kpọrọ gi nwayi nēnye nwa ara site na ndinyom Hibru, ka ọ we nyere gi nwa nka ara? 8Nwa-nwayi Fero we si ya, Je. Nwa-ab͕ọghọ ahu we je kpọ nne nwa ahu. 9Nwa-nwayi Fero we si ya, Kuru nwa nka la, nyerem ya ara, mu onwem gēnye kwa gi ugwọ-ọlu-gi. Nwayi ahu we kuru nwa ahu, nye ya ara. 10Nwa ahu we tó etó, nne-ya we me ka ọ biakute nwa-nwayi Fero, ọ we ghọrọ ya nwa nke ya. Ọ kpọ aha-ya Moses, si, N'ihi na nime miri ka m'dọputara ya.
11O rue na mb͕e ahu, mb͕e Moses toputaworo, na ọ pukuru umu-nne-ya, ihu ihe ngbu ha anya: o we hu nwoke Ijipt ka o nētib͕u nwoke Hibru, otù nime umu-nne-ya. 12Ọ we lee anya n'otù akuku, lee kwa anya n'akuku ọzọ, ma mb͕e ọ huru na ọ dighi onye ọ bula, o tib͕ue onye Ijipt ahu, zobe ya n'ájá. 13Ọ we pua n'ubọchi nke-abua, ma, le, ndikom Hibru abua nālu ọ̀gù: ọ we si onye ahu nke ikpe mara, N'ìhi gini ka i nētib͕u nwanne gi? 14Ọ si, Ònye mere gi ka i buru onye-isi na onye-ikpe n'ebe ayi nọ. Ọ̀ bu ib͕um ka gi onwe-gi nēkwu okwu-ya, dika i b͕uru onye Ijipt? Moses we tua egwu, si, N'ezie amawo okwu a. 15Fero we nu okwu a, ọ we chọ ib͕u Moses. Moses we b͕apu n'iru Fero, nọdu n'ala Midian: o we nọdu ala n'akuku olùlù-miri. 16Ma onye-nchu-àjà Midian nwere umu-ndinyom asa: ha we bia, se miri, b͕aju ebe anētiye miri ime ka ìgwè ewu na aturu nke nna-ha ṅua. 17Ndi-ọzùzù-aturu we bia, chupu ha: ma Moses biliri, zọputa ha, me ka ìgwè ewu na aturu-ha ṅua miri. 18Ha we biakute Reuel, bú nna-ha, ọ si, Gini mere unu ji bia ngwa ngwa ta? 19Ha si, Nwoke Ijipt o setara ayi miri nke-ọma, me ka ìgwè ewu na aturu-ayi ṅua. 20Ọ si umu-ya ndinyom, Òle ebe ọ nọ kwa? n'ìhi gini bu nka na unu arapuwo nwoke ahu? kpọnu ya, ka o we rie nri. 21Moses we kwere ibiri n'ulo nwoke ahu: o we nye Moses Zipora nwa-ya nwanyi na nwunye. 22Nwanyi ahu we mua nwa-nwoke, Moses we kpọ aha-ya Giashom: n'ihi na ọ siri, Ọbìa ka m'bu-woro n'ala ọzọ.
23O rue, n'ọtutu ubọchi ahu, na eze Ijipt nwuru: umu Israel we nēze ume n'ihi òfùfè-ha, ha we tie nkpu, ntiku ha tikuru Chineke we rigorue Chineke nti, n'ihi òfùfè ahu. 24Chineke we nu isu-ude-ha, Chineke we cheta ọb͕ub͕a-ndu-Ya, nke Ya na Abraham na Aisak na Jekob b͕ara. 25Chineke we hu umu Israel, Chineke we mara.

Currently Selected:

ỌPUPU 2: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy