YouVersion Logo
Search Icon

NDI KỌLỌSI 1

1
1Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus site n'ọchichọ Chineke, na Timọti nwa-nna-ayi, 2nēdegara ndi nọ na Kọlọsi akwukwọ, bú umu-nna-ayi nime Kraist ndi di nsọ kwe-kwa-ra ekwe: Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, puta.
3Ayí nēkele Chineke, bú Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, nēkpe ekpere bayere unu mb͕e nile, 4ebe ayi nuru okwu bayere okwukwe nke unu kwere na Kraist Jisus, na ihu-n'anya unu ji hu ndi nsọ nile, 5n'ihi olile-anya ahu nke edebeworo unu n'elu-igwe, nke unu nuru ihe bayere ya na mbu n'okwu nke ezi-okwu nke ozi ọma, 6nke biaruru unu; dika ọ nāmiju kwa nkpuru n'uwa nile, nāba kwa uba, dika ọ nēme kwa n'etiti unu, site n'ubọchi unu nuru mazu kwa amara Chineke n'ezi-okwu; 7dika unu mutara n'ọnu Epafras orù-ibe-ayi onye ayi huru n'anya, onye bu onye kwesiri ntukwasi-obi n'ijere Kraist ozi n'ọnọdu ayi, 8onye gosi-kwa-ra ayi ihun-anya-unu nime Mọ Nsọ.
9N'ihi nka ayi onwe-ayi kwa, site n'ubọchi ayi nuru ya, ayi ewepughi aka n'ikpe ekpere na iriọ aririọ n'ihi unu, ka ewe me ka unu juputa na nmazu nke ihe Ọ nāchọ nime amam-ihe na nghọta nile nke Mọ Nsọ, 10ka unu jegharia n'uzọ kwesiri Onye-nwe-ayi ime otú ọ gātọ Ya utọ n'uzọ nile, nāmi nkpuru n'ezi ọlu nile ọ bula, nāba kwa uba nime nmazu nke Chineke; 11ebe anēme ka unu di ike nime ike nile, dika ike nke ebube-Ya si di, rue ntachi-obi na ogologo-ntachi-obi nile, ya na ọṅù; 12nēkele Nna-ayi, Onye mere ka ayi rue iketa òkè-ayi n'ihe-nketa ndi nsọ n'ìhè; 13Onye dọputara ayi n'ike nke ọchichiri, we webiga ayi n'ala-eze nke Ọkpara nke ihu-n'anya-Ya; 14Onye ayi nwere nb͕aputa-ayi nime Ya, bú nb͕aghara nmehie nile ayi: 15Onye bu onyinyo nke Chineke ahu Nke anāpughi ihu anya, buru kwa onye eburu uzọ mu n'ihe nile ekère èkè; 16n'ihi na nime Ya ka ekère ihe nile, nke di nime elu-igwe na nke di n'elu uwa, ihe apuru ihu anya na ihe anāpughi ihu anya, ma ọ bu oche-eze, ma-ọbu ibu-ndi-nwe-madu, ma-ọbu ibu-ndi-isi, ma-ọbu ichi-isi; esitewo n'aka-Ya kè ihe nile, ekèwo-kwa-ra Ya ihe nile; 17Ya onwe-ya bū kwa ihe nile uzọ, ọ bu kwa nime Ya ka ihe nile nēguzokọ n'otù. 18Ya onwe-ya bu kwa isi aru, nke bu nzukọ-Ya: ebe Ọ bu Onye-nmalite, Onye eburu uzọ mu site na ndi nwuru anwu; ka ewe me ka Ya onwe-ya buru onye mbu n'ihe nile. 19N'ihi na ọ buri ihe di Nna-Ya ezi nma ka ozuzù nile bigide nìme Ya; 20ka O we site kwa n'aka-Ya me ka Ya onwe-ya na ihe nile di n'otù, ebe O sitesiri n'ọbara nke obe-Ya me ka Ya onwe-ya na madu di n'udo; site n'aka-Ya, ka m'kwuru, ma ọ bu ihe di n'elu uwa, ma-ọbu ihe di n'elu-igwe. 21Unu onwe-unu kwa, ọ bu ezie na emereri unu ka unu buru ndi ala ọzọ n'oge gara aga, buru kwa ndi-iro n'èchìchè-uche-unu nime ajọ ọlu nile unu, ma ub͕u a ka O mere ka unu na Ya di n'otù 22nime aru nke anu-aru-Ya, site n'ọnwu-Ya, iche unu n'iru Ya dika ndi di nsọ, ndi anāpughi kwa ita uta, ndi anāpughi kwa ibo ebubo: 23ma asi na ọ bu ezie na unu anọgide n'okwukwe-unu, ndi atọworo ntọ-ala, ndi nēguzosi kwa ike, ndi anādighi-ewepu kwa n'olile-anya nke ozi ọma ahu nke unu nuru, nke ekwusara n'etiti ihe nile ekère èkè nke di n'okpuru elu-igwe; nke emere mu onwem, bú Pọl, onye nēje ozi ya.
24Ub͕u a anamaṅuri ọṅu n'ahuhu m'nāhu n'ihi unu, anamemezu kwa n'akuku nkem ihe fọduru na nkpab͕u nile nke Kraist-ayi n'anu-arum n'ihi aru-Ya, nke bu nzukọ-Ya; 25nke emere mu onwem onye nējere ya ozi, dika ọlu ọchichi-èzí-na-ulo nke Chineke si di nke enyerem n'ebe unu nọ, ikwuzu okwu Chineke, 26bú ihe-omimi nke ezoworo ezo site n'oge nile site kwa n'ọb͕ọ nile: ma ub͕u a ka emere ya ka ọ puta ìhè nye ndi nsọ Ya, 27ndi Chineke chọrọ ime ka ha mara ihe bu àkù nke ebube nke ihe-omimi a n'etiti ndi mba ọzọ, nke bu Kraist nime unu, bú olile-anya nke ebube ahu: 28Onye ayi nēkwusa, nādu madu nile ọ bula ọdú, nēzí kwa madu nile ọ bula n'amam-ihe nile, ka ayi we che madu nile ọ bula n'iru Onye-nwe-ayi dika ndi zuru okè nime Kraist; 29anamadọb͕u kwa onwem n'ọlu ime ihe a, nāb͕asi nb͕a ike dika i1usi-ọ1u-ike nke Ya si di, nke nālusi ike nimem n'ike.

Currently Selected:

NDI KỌLỌSI 1: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy