Ma Chineke nke udo, Onye were ọbara nke ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ahu si na ndi nwuru anwu kughachi oké Onye-ọzùzù-aturu nke aturu-Ya, bú Onye- nwe-ayi Jisus, Ya me ka unu zue okè n'ezi ihe nile ọ bula ime ihe Ọ nāchọ, nēme nime ayi ihe nātọ ezi utọ n'iru Ya, site n'aka Jisus Kraist; Onye otuto nile diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.