Asi na osisi fig adighi-ama ifuru,
Na ọ dighi ihe-ọmume di n'osisi vine;
Na ihe aluputara n'osisi olive ebilatawo,
Na ubi nile emeghi ihe-oriri;
Na ebipuwo ìgwè ewu na aturu n'ogige ewu na aturu,
Na ọ dighi ìgwè ehi di n'ulo ehi:
Ma mu onwem gāṅuri ọṅu nime Jehova,
M'gēteghari egwú ọṅù nime Chineke nke nzọputam.