Ífè ChinekeIhe Nhụchatụ

Onyinye Ime Mmụọ Gasị na Òfùfè
Mgbe eji onyinye ibu amụma na isú n'ire ana amaghị ama eme ihe n'ụlọ ụka, ha na-ebute ntụgharị gasị nke obi ndị mmadụ ka ha bịakwute Chineke. Mgbe Jizọs rụrụ ọrụ ebube, Ọ na-asị, "Gakwuru onye nchụàjà; mee ka o ji anya ya abụọ hụ gị. Ka ọ hụ na ị bụghịzi onye ekpenta." E nweghị mkpa ọ dị ikwu ihe n'emeghị eme ma ọ bụ ịghọ aghụghọ.
Onyinye gasị nke ime mmụọ bụ́ ezi ya ga-apụta na ndị mmadụ agaghị asị na ọrụ ebube gasị e mere bụ ụgha: agaghị asị na ọgwụgwọ gasị e mere bụ ụgha—ma obi ndị mmadụ a tụgharịa ha wee bịakwute Chineke.
Mana ọbụlagodi mgbe eji onyinye gasị nke ime mmụọ bụ́ ezi ya arụ ọrụ, ọ bụghị Ndị Kraịst niile nwere ha. Anyị niile nwere onyinye dị iche iche, ma onyinye nke ọbụla Chineke nyere anyị dịkwa mkpa maka iji rụọ ọrụ n'ụlọ nsọ Ya. Na anụ ahụ anyị, ọ bụrụ na anyị merụrụ ahụ na mkpịsị ụkwụ anyị kachasị nta, ihe nke ahụ ga-afugbu anyị ma anyị anọrọ na mgbu ogologo oge nke ụbọchị ahụ. Akụkụ kachasị nta nke ihe pụrụ imetụta akụkụ niile nke ihe ahụ.
Mgbe anyị rurù Eluigwe, ka esi etú ndị mmadụ ùgò ga-adị iche na ka esi eme ya n'ụwa. N'eluigwe, aga enye onye ahụ bụ mkpịsị ụkwụ kachasị nta otu onyinye a ga-enye onye ahụ bụ anya ma ọ bụrụ na nke ahụ bụ mkpịsị ụkwụ kachasị nta rụrụ ọrụ ya nke ọma.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ọgụgụ ọbụla kwa ụbọchị n'enye nkọwa na amamihe gbasara otù esi efe Chineke òfùfè n'akụkụ niile nke ndụ nakwa ọ gà-akpali ndị n'agụ ya idebe obi ha dum na mmekọrịta ha na Kraịst. Ihe òfùfè a dị dabere na akwụkwọ R. T. Kendall derè, Ifè Chineke. (R. T. Kendall bụ ụkọchukwu Westminster Chapel na London, England, ruo afọ iri abụọ na ise.)
More