Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ífè ChinekeIhe Nhụchatụ

Worshipping God

ỤBỌCHỊ 4 NKE 6

Iji Ụdịdị Gị Niile Fee Òfùfè

Mgbe anyị n'ekwu maka mkpali nke Mmụọ Nsọ, anyị n'ekwu kwa maka mmetụta uche. Ekwenyere m na nke a dị ezigbo ize ndụ, n'ihi na mmetụta uche nwere ike iduga ndị mmadụ ime ihe ha n'ekwesịghị ime.

Ndị mmetụta uche ha na-apịa ha ụtarị karịa ndị ọzọ, n'ihi ikpe ọmụma nke uche ha, nwere ike ịchọ ihichapụ omume nzuzu ha mere site n'ime ihe ha cheerè bụ uche Chineke. Mmadụ nwere ike ichè na ihe n'aga n'ime obi ya bụ mkpali nke Mmụọ Nsọ mgbe ihe niile ọ n'eme bụ ihe sitere n'uche ya dịka mmadụ ikpochapụ ọdịda o mere n'oge gara aga. Mkpali nke Mmụọ Nsọ, mgbe e rubeerè ya isi, na-eduga mgbe niile na mmetụta uche nke udo dị ukwuu.

Ọ dị mfe ichè na mkpali nke kachasị dị mkpa bụ nke ụbụrụ n'enwu ọkụ ma ọ bụ nke dị oke omimi. Mana Chineke chọrọ ka anyị na Ya na-akpakọrịta abụghị naanị n'ọkwá ọgụgụ isi. Chineke chọrọ ka Ya na ihe niile anyị jiri bụrụ mmadụ na-akpakọrịta—mmetụta uche anyị niile, ma ka anyị si eche echiche na uche anyị dum.

Òfùfè bụ ezi ya na-ewere ọnọdụ mgbe anyị n'enweghị egwù ikwupụta ka o si dị anyị n'obi. Òfùfè kwesịrị ịkpọrọ anyị bịa n'ebe anyị ga n'ekwuzi eziokwu n'ihu Chineke. Ọ dịghị mgbe anyị kwesịrị ikpàchì ka o si n'eme anyị ma ọ bụ dị anyị n'obi mgbe anyị nọ n'ihu Jizọs. Ọ gaghị abara anyị mba maka eziokwu nke obi anyị, anyị n'ekwu. Ọ pụtaghị na ihe anyị n'ekwu ziri ezi, mana ọ bụrụ na okwu ndị anyị n'ekwu sitere n'eziokwu nke obi anyị, Ọ ga enyere anyị aka ma kpọrọ anyị bịa n'ebe anyị ga-ahụ ka anyị siri kwujọọ ma ọ bụ mejọọ ma chee eziokwu ihu.

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Worshipping God

Ọgụgụ ọbụla kwa ụbọchị n'enye nkọwa na amamihe gbasara otù esi efe Chineke òfùfè n'akụkụ niile nke ndụ nakwa ọ gà-akpali ndị n'agụ ya idebe obi ha dum na mmekọrịta ha na Kraịst. Ihe òfùfè a dị dabere na akwụkwọ R. T. Kendall derè, Ifè Chineke. (R. T. Kendall bụ ụkọchukwu Westminster Chapel na London, England, ruo afọ iri abụọ na ise.)

More

Ọ ga-amasị anyị ikele R. T. Kendall na Charisma House maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://bit.ly/kendallkindle