Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ífè ChinekeIhe Nhụchatụ

Worshipping God

ỤBỌCHỊ 1 NKE 6

Ibi Ụzọ Ndụ Òfùfè

Mgbe m bụ onye n'akpọ ngwá egwú obo n'ime ìgwè ndị n'akụ egwú, a mụtara m na mgbe onye n'eduzi egwú nwetara otu akwụkwọ-egwu maka ọkpụkpọ na ọgụgụ, ọ chọrọ ka onye niile mụọ ya n'ime izu. Ya mere na ọ dị mkpa ka m jiri kọpị akwụkwọ-egwú ahụ laa ụlọ. Ma kà ìgwè ndị n'akụ egwú si mee nke ọma n'oge a na-agụgharí yabụ egwú ga-adabere na kà onye ọ bụla sịrị mụọ akwụkwọ egwú nke ya.

Otú ahụ ka ọ dịkwa n'ife òfùfè. Ọ bụrụ na anyị bụ ndị ihu abụọ, ọ bụrụ na ihe anyị kwenyerè na ya adịghị egosipụta na ka anyị si ebi ndụ, mgbe anyị bịara ụka ka anyị fee Chineke òfùfè ma gụọ egwú, egwú anyị na-agụ ga n'ada ka mkpọtụ ma ọ gaghị adị ụtọ na ntị Chineke ma ọlị.

Ụdị mmadụ anyị bụ, awa iri abụọ na anọ nke ụbọchị, dị mkpa karịa ihe n'eme n'ụlọ ụka otu ugboro n'izu. Ihe nzuzo dị uru nke inye òfùfè a na-anakwere dabeere na ụdị mmadụ anyị bụ n'ụlọ ma n'ebe anyị na-arụ ọrụ, na mgbe anyị nọ naanị anyị ma ọ dịghị onye maara ihe anyị na-eme. Ọ dabeere na ka anyị si ebi ndụ anyị dum.

Ụzọ anyị si echebe onwe anyị ụbọchị isii n'ime izu ka anyị ghara ịbụ ndị ihu abụọ bụ itinye Okwu Chineke n'ọrụ na ndụ anyị. Iji mee nke a, anyị ga-ewepụrịrị obi ilu niile site na ndụ anyị. Anyị ga-agba mbọ hụ na ndụ anyị juputara na ịhụnanya na mgbaghara n'enweghị mgbághá na ịnabata ibe anyị ka onwe anyị. Anyị ga-ebirirí ndụ nke itinye ọdịmma ndị ọzọ elu karịa nke onwe anyị, n'achọ oge niile naanị ịhụ Chineke n'anya na ife Ya òfùfè n'ịdị nsọ, n'iwetu onwe anyị na-ala, na ikpe ekpere.

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Worshipping God

Ọgụgụ ọbụla kwa ụbọchị n'enye nkọwa na amamihe gbasara otù esi efe Chineke òfùfè n'akụkụ niile nke ndụ nakwa ọ gà-akpali ndị n'agụ ya idebe obi ha dum na mmekọrịta ha na Kraịst. Ihe òfùfè a dị dabere na akwụkwọ R. T. Kendall derè, Ifè Chineke. (R. T. Kendall bụ ụkọchukwu Westminster Chapel na London, England, ruo afọ iri abụọ na ise.)

More

Ọ ga-amasị anyị ikele R. T. Kendall na Charisma House maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://bit.ly/kendallkindle