Ífè ChinekeIhe Nhụchatụ

Ọṅụ Nke Ịnọ Jii Emeghị Ihe Ọbụla
O nwere ụdị òfùfè dị omimi karịa ndị ọzọ, ụdị òfùfè nke na anyị apụghị ikwu okwu ma ọ bụ megharịa ahụ ma ọ bụ mee ngosipụta n'ụdị ọbụla— ụdị òfùfè ebe anyị nọ nnọọ jụụ emeghị ihe ọbụla. Òfùfè kachasị elu na nke dị omimi karịa omimi bụ nke n'emenụ mgbe anyị n'apụghị ime ihe ọbụla naanị ịnọ jii wee dị njuanya, mgbe e mere ka obi na ọnụ ju anyị jirí ịma mma Chineke ma ime ahụ anyị niile abụrụ sọ ekele, mgbe anyị n'anọ nnọọ jii wee n'elele Chineke ka Ọ n'arụ ọrụ.
È tinyetulá gị n'ọnọdụ ebe ịna enweghị ike ikwu okwu ma ọ bụ mee ihe ọbụla? Mmadụ meere gị ihe dị gị ezigbo ịtụnanya, mana ị pụghị ime ihe ọbụla naanị inwe nnukwu obi ekele? O nwerè ike ịbụ na onye ahụ gara ebe dị anya, ya adị gị ka gị chọta ya wee gwa ya imeela maka ihe ọma dị ukwu otù ahụ o meere gị. O nwerè ike ịbụ na obi adịghị gị mma, ma ụfọdụ ọṅụ gị efunahú gị n'ihi na ị nweghị ohere iji kelee onye ahụ meere gị ihe ọma otu o si dị gị n'obi. Dịka mmadụ, ọ na-adị anyị na anyị kwesịrị ime ihe n'ụdị ọnọdụ dị otù ahụ.
Asịghị m ka anyị ghara inwe mmetụta ọbụla, kama ka anyị ghara ime ihe ọ bụla. Nke a, ka Aịzaya kwuru, bụ ụzọ kachasị mma isi wee bie ndụ—ụzọ Chineke chọrọ ka anyị si n'ebi ndụ. Ọ bụ ụzọ nwere ọṅụ kachasịnu. Ma n'agbanyeghị na ọ dị ka a kpọnwụrụ aka anyị na ụkwụ anyị—dị nnọọ ka anyị kwụ̀ ebe ahụ ghewa ọnụ anyị oghe—Chineke n'ahu ihe niile n'aga n'obi anyị, Ọ maarakwa na anyị jupụtara n'ekele.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ọgụgụ ọbụla kwa ụbọchị n'enye nkọwa na amamihe gbasara otù esi efe Chineke òfùfè n'akụkụ niile nke ndụ nakwa ọ gà-akpali ndị n'agụ ya idebe obi ha dum na mmekọrịta ha na Kraịst. Ihe òfùfè a dị dabere na akwụkwọ R. T. Kendall derè, Ifè Chineke. (R. T. Kendall bụ ụkọchukwu Westminster Chapel na London, England, ruo afọ iri abụọ na ise.)
More