Ífè ChinekeIhe Nhụchatụ

Otù Esi Enwe Òfùfè Nke Eji Ndụ Bipụtá
Anyị kwesịrị ikwe ka Chineke bụrụ onwe Ya n'ime anyị. Nke a pụtara na anyị kwesịkwara ikwe ka Ọ bụrụ Onwe Ya n'ime ndụ ndị ọzọ. Anyị ekwesịghị ikwuto ụzọ na ka onye ọzọ si efe Ya òfùfè.
Mana òfùfè dị nhọrọ ma ọ bụ òfùfè e mere ka ọdị ka ihe nkpori ndụ ama ama nke ụwa, òfùfè nke naanị mmetụta uche na nke ịchọ mma na ihe a n'ahụ anya abụghị ezi òfùfè. O nwere ụdịdị a na-ahụ anya mana ọ dịghị uru ọbụla dị na ya. Agụụ nke obi anyị bụ òfùfè dị ndụ. Mana olee otú esi enwete nke a?
Ụlọ ụka anyị gasị ekwesịghị ịbụ ebe ndị obi ha kpọrọ nkụ nye Chineke na-abịa kwa Sonde n'ihi na “egwú anyị ji eme òfùfè masịrị ha.” Ụlọ ụka anyị gasị kwesịrị ịbụ ebe ndị ajọ omume ekwesịghị inwe obi iru ala n'ihi na Mmụọ Nsọ bụ Onye dị mkpa, Ọ bụ Ya bùkwa ụzọ n'ihe niile a n'eme. Ụkpụrụ nchịkwa anyị kwesịrị ịbụ nrubeisi nye Mmụọ Nsọ—n'agbanyeghị ebe ọbụla O dù anyị eje.
Abụ Ọma 37:4 bụ eziokwu nye anyị niile, onye ọbụla anyị bụ ma ọ bụ ihe ọbụla anyị chọrọ. Mana mgbe anyị n'enwe aṅụrị anyị n'ime Onye-nwe-anyị, ụfọdụ agụụ obi anyị nwerè ike ịkpọnwụcha ma ọchịchọ ọhụrụ gasị amalite n'elu ha. Ya mere na ọ gaghị adị mma ísí na kwunyesie ike ụdị ụzọ ma ọ bụ otù òfùfè anyị kwesịrị ịdị. Anyị ga-ebu ụzọ hụ n'eziokwu na anyị n'enwe aṅụrị n'ime Onye-nwe-anyị, wee hụ ihe Chineke n'eme.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ọgụgụ ọbụla kwa ụbọchị n'enye nkọwa na amamihe gbasara otù esi efe Chineke òfùfè n'akụkụ niile nke ndụ nakwa ọ gà-akpali ndị n'agụ ya idebe obi ha dum na mmekọrịta ha na Kraịst. Ihe òfùfè a dị dabere na akwụkwọ R. T. Kendall derè, Ifè Chineke. (R. T. Kendall bụ ụkọchukwu Westminster Chapel na London, England, ruo afọ iri abụọ na ise.)
More