Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ífè ChinekeIhe Nhụchatụ

Worshipping God

ỤBỌCHỊ 2 NKE 6

Ekpere Jupụtara N'ike Nke Mmụọ Nsọ

Pastọ ama ama gburugburu ụwa, Arthur Blessitt, kọrọ akụkọ maka otu ndị ụlọ ụka kpebiri izukọ otu ehihie Satọdee ikpe ekpere ka Chineke kpalie obi ndị mmadụ dị ha gburugburu ibido chọwa ihu Chineke wee bịawa ụka. Ihe ruru ndị nwoke iri anọ bịara, nọdụ ala n'ime sekụl buru ibu, wee malite ikpe ekpere.

Mana ọ dịghị ihe n'egosi na ọnịnọ Chineke dị n'etiti ha.

N'oge ahụ, Arthur lepụrụ anya na windo, wee hụ otu ụlọ nri dị n'akụkụ ọzọ nke okporo ụzọ ahụ. O nwere mkpali n'ime ya ka o bilie gaa ebe ahụ, ya wee mee otù ahụ.

O guzorò n'ime ụlọ nri ahụ wee sị, “Ọ dị onye ọ bụla nọ ebe a chọrọ ka a zọpụta ya?"

Otu nwaanyị n'ebutere ndị mmadụ nri ha kwụrụ ụgwọ ya si, “Ee, achọrọ m."

Arthur kọwaara ya Ozi Ọma Jizọs, wee duru ya baa n'ime Chineke ka ọ bụrụ nke Kraịst.

Mgbe o mechara nke a, ọ jụrụ nwaanyị a ma ndị ụka ahụ dị n'akụkụ nke ọzọ nke okporo ụzọ ma ha agwatụbela ya maka Jizọs Kraịst ma ọ bụ kpọọ ya òkù ka ọ bịa ụka.

Nwaanyị a sịrị, "Mba, ọ dịbeghị otu onye n'ime ha mere otù ahụ."

Mana ndị ahụ bụ ndị nọ n'ekpe ekpere ka Chineke metụ ndị mmadụ aka n'obi ka ha bịa ụka.

Ejikwàlà Mmụọ Nsọ n'ihi echiche nke gị bụ na ụzọ òfùfè gị ịma amá na nke dị gị mfe bụ ụzọ Ọ chọrọ isi wee mee ihe. Ọ dị mkpa ka ndị nwoke iri anọ ahụ si na ime mmụọ ha nwụrụ anwụ teta. Òfùfè na ekpere nke Mmụọ Nsọ duziri pụtara iso mkpali Ya.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Worshipping God

Ọgụgụ ọbụla kwa ụbọchị n'enye nkọwa na amamihe gbasara otù esi efe Chineke òfùfè n'akụkụ niile nke ndụ nakwa ọ gà-akpali ndị n'agụ ya idebe obi ha dum na mmekọrịta ha na Kraịst. Ihe òfùfè a dị dabere na akwụkwọ R. T. Kendall derè, Ifè Chineke. (R. T. Kendall bụ ụkọchukwu Westminster Chapel na London, England, ruo afọ iri abụọ na ise.)

More

Ọ ga-amasị anyị ikele R. T. Kendall na Charisma House maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://bit.ly/kendallkindle