Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Kulie, Jìrí Obi Ike Gaa Ihu Na NdụIhe Nhụchatụ

Don't Settle For Safe

ỤBỌCHỊ 3 NKE 3

Bie Onye Ịbụ̀ N'ezie

Ihe niile ịchọrọ iji maa mma, n'eme nke ọma, dị ịtụnanya, dị ngọzi, bụrụ onye ana atụkwasị obi, dị nkwanye ùgwù, bụrụ onye ana asọpụrụ, na dị aṅụrị, adịlarị na ndụ gị. O nwerè ike ọ dịghị gị otù ahụ mana nkè ahụ bụ n'ihi na ịna elekwasị anya n'ihe ndị n'ezighi ezi. Ihe ọ bụla a mụrụ n'erughi eru na-enwekarị nsogbu. Nsogbu ndị ahụ ị nwerè nke mere ka ị kwụsị ikwenye n'ịdị nma Chineke bụ ihe ndị ịmụpụtara mgbe oge n'erubeghị. N'agbanyeghị nke ahụ, Chineke dị obi ọma iji ha kuziere gị ihe mmụta sité na njem ahụ nke mere ka ị dịkwuo mma ka O ji gị wee mee ihe.

Ejila aka gị para ndụ gị. Jikwaa akụkụ obi gị nke n'eche na ị kà Chineke mara ihe. Nwee nkwenye na ọ bụrụ na ị kà nwebeghị ihe ịna achọ ma ọ bụ n'arịọ Chineke, ọ bụ n'ihi na ị dịghị njikere inata ya. Nwee nkwenye na ọ bụrụ na o nwere ihe dị gị n'aka ugbu a, ọ bụ n'ihi na ị nwere ikike na dị njikere ijikwa ya. Enwezila obi abụọ kà ike gị hà na anwazilà amara Chineke ọnwụnwa. Emela ihe dị gị kà o ziri ezi; kama, mee ihe ga-eme ka ị bụrụ ezigbo mmadụ karịa ka ị bụ. Nke ahụ nwere ike ime ka ogo ọzụzụ ndụ gị gị laa elu, ma ọ bụ ka ị tughekwuo onwe gị nye Chineke. Aga enwe ọtụtụ ihe pụrụ inye gị mgbapụ-ọsọ n'ebe adịghị ike gị na erughị eru gị gasị. Ejila ha mee ihe. Kama, hụ ihe ndị ahụ n'esogbu gị dịka ihe ha bụ: ebe na akụkụ gasị ịhụnanya pụrụ imejupụtà. Hụ onwe gị n'anya nke ukwuu nke na ihe ndị ahụ ịna ahuta ka adịghị mma nke ndụ gị aghaghị ịghọ ihe ndị mara mma.

Nwee ndidi. Ozugbo i ruru ebe ahụ i tụrụ anya irute n'ije ndụ gị, ị ga-ahụkwa na ọrụ kà dịkwa ebe ahụ ị ga-arụ. Mgbe ahụ ị ga-achọ ka oge jiri nwayọọ n'aga ka ị nwee ike jiri anya gị lezuo ịma nma nke ebe ị ruterè. Chọta ihe mara mma ịga n'enwe aṅụrị na ha kwa ụbọchị. Lefee ụgwọ ndị ahụ iji anya, obi mgbowa ahụ mere gị, nne gị ahụ n'anwụ anwụ, nna gị n'anọghị ya, nwa gị ahụ n'enye gị nsogbu, na atụmatụ ndụ gị niile n'emezughị. Hụ ịma nma nke inweta ụbọchị ọzọ na ohere ọzọ iro nrọ ndụ. Họrọ ịkwụsị ichekasị onwe gị na ịtụgharị uche na kà ihe gasị garà ịdị. Too Chineke n'ihi na ịdịghị njikere inakwere na ịnabata ihe ndị ahụ oge ahụ.

Mgbe ị malitere ịchọta onye ị bụ n'ezie, ndị mmadụ kà gà n'achọ ihu akụkụ gasị nke onwe gị ahụ dị ochie. Ọchịchọ ụfọdụ ndị agaghị aga nke ọma banyere nke a; ebe ụfọdụ ga-enwe afọ ojuju n'ịmụta onwe gị ọhụrụ a diwanyeré mma. Mee emume olili ozu maka ndị chọrọ iká na-ahuta gị jiri anya mmehie gị, mmejọ gị na mkpebi ọjọọ gasị ị merè n'oge gara aga. Ọ bụrụ na ha achọghị ịhapụ gị aka ka ị bie ndụ ọhụrụ gị n'udo, ọ ga-apụta na ha ekwesịghị ịnọ na ndụ gị ma ọlị. Gbapụ ha. Mana elela ụdị mmadụ ndị ahụ anya ka ha bụ ndị ọjọọ. Hụ ha ka ndị ndú ha tiwara etiwa na ndị obi ha enweghị ahụike. Ekwela ka ha chiri nsogbu nke ndụ ha bịa wakpọọ gị. Ekwela ka ị chefuo onye ịbụ n'ihi na ịchọrọ ịzọpụta ha. Sie na dị ezigbo ike ị họrọ onwe gị n'ije ndụ i n'eje.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Don't Settle For Safe

Ọ bụrụ na olu gasị nke enweghị nchebe, obi abụọ, na egwù abụghị nke e cherè ihu, ha ga-achị ndụ gị. Ị nweghị ike imechi olu ha ma ọ bụ leghara ha anya. N'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị atọ, Sarah Jakes Roberts na-egosi gị otu ị ga-esi kuchie ọnụ mgbochi gasị nke si na ndụ gị gara aga wee nabata ihe ndị ahụ dịka ha dị nsogbu ka ị wee bụrụ onye ihe ọbụla n'apụghị ịkwụsị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Sarah Jakes Roberts na Thomas Nelson maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://bit.ly/YV-DontSettleforSafe