Kulie, Jìrí Obi Ike Gaa Ihu Na NdụIhe Nhụchatụ

Gịnị Bụ̀ Usoro Gasị Nke Ndụ Gị?
Ò nwetulá mgbe ị wepụtara oge tụlee usoro gasị nke mmetụta uche gị? Tụlee echiche gasị i n'eche oge niile ná-emepụtá mmetụta uche n'eme ugboro ugboro wee n'ebute akparama-àgwà ndị i n'emekarị. Íghọtá usoro ndị ahụ gà-emé ka anyị meghee ebe gbara ìtìrì gasị nke obi anyị wee n'atughechá ncheta gasị anyị chè na anyị apụghị iweli ísí ha ọzọ. Anyị kwesịrị ịmalite ịjụ onwe anyị: Gịnị merè ụdị ihe a jiri mee m? Gịnị ka ọ kụziiri m? Kedụ ihe m ga-eme ka ọ ghara imekata mee ọzọ?
N'ezie ọ bụghị usoro niile dị njọ. Ụfọdụ usoro dị̀ nnọọ mma nke na ha kwesịrị ka anụchaa ha ma na-emekwa ha n'oge nile nke ndụ anyi. Onyinye kachasị i pụrụ inye onwe gị bụ ikike ịchọpụta usoro ndị kepụtara ísí ihe gasị na ndụ gị. Usoro ndị ahụ nwerè ike ha agaghị apụ kpamkpam, mana ọ ga-ekwe omume na ị ga-ebido matawá ha wee malite narawá ha ikike ha ahụ niile ha ji achịkwa ndụ gị.
Agbara m ezigbo mbọ inyopụtachà mmetụta uche m gasị ma n'egosipụta ha n'oge kwesịrị ekwesị. Mgbe ọ dị gị ka o nwerè kà mmetụta uche gị si chigháriá, wepụta nwa oge leba anya na detuo ihe mere ụdị nchigharí ahụ jiri mee. Asịla naanị na ọ bụ maka o nwerè ka ahụ si eme gị. Chọpụta mgbọrọgwụ ihe n'egbochi gị inwe ọñụ zuru okè. Ọ ga-atụ gị n'anya ka ị ga-esi nwere onwe gị mgbe ị kwupụtacharà mmetụta-uche ndị ahụ niile na gbaa ha n'anwụ.
Ị̀ nwerè ike ichetà akụkụ gasị nke ndụ gị ebe i nwere ihere, ihe mgbu, na mmechu-ihu jọgburu onwe ya? Ò nwerè ncheta-gasị kpọmkwem tapará na ha? Kedụ ka otu isi ele onwe gị na ndị ọzọ anya siri gbanwee n'ihi ihe ndị ahụ? Ịghọta ihe n'akpata usoro nke ndụ gị gasị bụ naanị ụzọ i pụrụ ịjị kpọchapụ ya kpamkpam na ndụ gị. Ozugbo i malitere ịghọta ụfọdụ usoro gasị n'adịghị mma tapará na ndụ gị, ọ dị mkpa ka ị bilie buso ha agha. Agha ahụ ga-adị n'ụzọ iji echiche gasị dị mma, dị uru na ndị n'eme ezi mkpali megide echiche na mmetụta uche ndị ahụ n'adịghị mma.
Ịbụrụ onwe gị tusaa n'ihu Chineke n'agbaji aka na ike ihe ọjọọ nwerè na ndụ gị. Enwerè ụfọdụ ihe dị n'ime ndụ anyị dị oké arọ́ na ibú anyị ipa ha n'onwe anyị. Nsetipụ-aka na ike Chineke dị anyị mkpa ichetarà anyị na e nwerè akụrụngwa dị adị nye anyị, dị nnukwu ike karịa nsogbu niile gbara anyị gburugburu. Ị dịghị alụ ọgụ̀ a n'onwe gị. Chineke nwerè atụmatụ zuru okè na nzube maka ndụ gị. Tụkwasị obi na atụmatụ Ya, nke gụnyere aṅụrị, udo, na ịhụnanya. Nke ahụ bụ ụdị echiche dị mgbanwe n'enye ìhè n'ime ọbụna akụkụ na ebe gasị gbara oké ọchịchịrị.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ọ bụrụ na olu gasị nke enweghị nchebe, obi abụọ, na egwù abụghị nke e cherè ihu, ha ga-achị ndụ gị. Ị nweghị ike imechi olu ha ma ọ bụ leghara ha anya. N'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị atọ, Sarah Jakes Roberts na-egosi gị otu ị ga-esi kuchie ọnụ mgbochi gasị nke si na ndụ gị gara aga wee nabata ihe ndị ahụ dịka ha dị nsogbu ka ị wee bụrụ onye ihe ọbụla n'apụghị ịkwụsị.
More