Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Kulie, Jìrí Obi Ike Gaa Ihu Na NdụIhe Nhụchatụ

Don't Settle For Safe

ỤBỌCHỊ 1 NKE 3

Ị Pụrụ Ime Ihe Niile

Ọtụtụ ndị mmadụ na agba mbọ ka ha merie ụjọ wetara ha mmechu-ihu dị ukwuu mgbe gara aga, nke mere na ebumnuche ọbụla ha n'enwe bụ nke apịtị nchegbu ọdịdà n'èté ka uhie. Mgbe echiche gị jupụtara na ihe dị iche iche nke n'ajụ ajụjụ "gịnị ma ọ bụrụ," ohere agaghị adị maka okwukwe. Ibi ndụ ná njikere maka ihe ọjọọ kachasịnụ ime dịka ibi ndụ n'ime ụlọ mkpọrọ—ihe ahụ abụghị nnwere onwe. Ka oge na-aga, ị ga-amata ihe dị iche n'etiti íchebé obi gị na ikpachibidò ya. Ị ga-amụta ịkwụsị ịgwa onwe gị okwu mgbochi nye ihe ọma gasị Chineke kwerè na nkwa maka ndị niile n'ebi ndụ na nzube Ya.

Gị, bụ́ enyi m gabigarà mmekpa ahụ nke ụwa a wee merie, agaghị anakwere ibi ndụ nke ụjọ na ahụmahụ ọjọọ gara aga na-achịkwa. Ị nwerè ohere inata ikiki nke pụrụ ịrụ ọrụ n'ime gị ịnapụta gị n'agbụ uche ma ọ bụ nke mmetụta-uche ọbụla, n'agwa gị na ị pụghị ibi ndụ mara mma. Anyị apụghị itinye aka n'ike dị otù ahụ wee ka n'anakwere adịghị ike ọbụla. Obi gị, uche gị, na aka gị abụọ gà-adírírí nnwere onwe ha ijigidesì ike ihe ọma gasị dị n'ihu gị.

Ntọhapụ adịghị-ike na ume ngwu ọbụla bụ ọzụzụ anyị gà-ejírírí echiche anyị, nkwurịta-ụka anyị na omume anyị mee. Ohere naanị dịnụ bụ̀ nke asụsụ na-ekwupụta: M gà eme ya! Òtútó n'eme mgbe anyị n'eji obi ike chee ahụmahụ anyị gasị ihu na ka ha siri gbanwee anyị. Ị pụrụ imepụta usoro ime ihe ọhụrụ wee jiri mkpebi dị ike gaa ihu na ndụ, mana ị gà-amụtarírí ihe ndị kwụsịrị gị n'oge gara aga. Ọ bụrụ na ihe ịma-aka nke inweta ọgwụgwọ na ịdị nnwere onwe siteré n'aka ndị ọzọ, ọ ga-apụta na njem gị nke ọgwụgwọ na nnwere onwe gà ná anatarírí nnakweré n'aka ndị ahụ tupu ọ gaa n'ihu.

Ekwela ka ije ụwa gị bụrụ ihe ọha mmadụ n'ekpebi. Ndị gbara gị gburugburu nwerè ike ha agaghị ama ka ha ga-esi mesie gị obi ike maka obi mgbowa mere gị, ma ọ bụ nke kachasị njọ, o nwerè ike bụrụ na nnọkọ irú újú gị dị ha mkpa ka ha ghara ịchọta na nweta ọgwụgwọ nke onwe ha. Zèré ọnwụnwa nke ime ka ọgwụgwọ gị bụrụ nke i gà anatarírí ee na gaa-n'ihú n'aka ndị mmadụ.

Àkwà-mmiri nkè site n'onye ị bụ n'oge gara aga rute nà onye Chineke kere gị ka ị bụrụ bụ nke e mepụtara site na ọkpụ́kpụ́ nkume nke adịghị ike, ịdị umeala n'obi nke siri ike ka sìmentị, na atụmatụ bụ isi nke dị oké nzu òkè, na ọbụna ihe ndị merụrụ gị ahụ na obi n'arụ ọrụ ime ka ị dịkwuo mma na bụrụ kwuo ezigbo mmadụ. Njikere gị ịhapụ adịghị ike gị na ume ngwu gị na mkpebi gị ịga n'ihu n'agbanyeghị ihe ọ bụla, tụkwasịrị nkume nke mbụ, mana ọtụtụ ọrụ nọ cheré gị.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Don't Settle For Safe

Ọ bụrụ na olu gasị nke enweghị nchebe, obi abụọ, na egwù abụghị nke e cherè ihu, ha ga-achị ndụ gị. Ị nweghị ike imechi olu ha ma ọ bụ leghara ha anya. N'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị atọ, Sarah Jakes Roberts na-egosi gị otu ị ga-esi kuchie ọnụ mgbochi gasị nke si na ndụ gị gara aga wee nabata ihe ndị ahụ dịka ha dị nsogbu ka ị wee bụrụ onye ihe ọbụla n'apụghị ịkwụsị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Sarah Jakes Roberts na Thomas Nelson maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://bit.ly/YV-DontSettleforSafe