Akụkọ Nke IstaIhe Nhụchatụ

SONDE
N'ụbọchị a magburu onwe ya, anyị ga-eji nwa oge tụgharịa uche na obe Ya, ili tọgbọ chakọọ na ihe niile o nyeworò anyị. Mana ka anyị tụgharịkwaa uche na ihe omume asi anyị mee ụbọchị taa "pụọ nụ n'ezi gaa metanụ̀ ndị ọhụrụ n'eso ụzọ..." Oziọma dị ọcha Kraịst nyeferè n'aka ndị ụmụ azụ Ya bụ̀ ozi ọma nke amara a pụrụ ịnyefe enyefè, abụghị naanị ka anata ya. Jizọs nyerè ụmụ azụ Ya ikike na nkwado nke ịpụ meta ndị ọzọ n'eso ụzọ, na imi mkpụrụ. Anyị ji anya anyị abụọ na-ahụ na ikike a na nkwado a rụrụ ọrụ na dị irè n'ihi na ndị ụmụ azụ Ya metarà ka ndị n'eso ụzọ, metakwarà ndị ọzọ kwa ndị ọzọ n'eso ụzọ. Ikike a na nkwado a na mmeta ndị n'eso ụzọ abụrụ ihe emerè nyefè kwa nyefè gafee afọ puku abụọ. Mana eleghị anya, n'ọgbọ ọbụla, dịka nke anyị a, mgbe ụfọdụ Oziọma anyị na-ekesa na aghọ ihe n'esighị ike. Kama ịmità mkpụrụ n'ezie, anyị a n'azụ mkpụrụ na-apụghị ịmita mkpụrụ ọbụla. Kà anyị n'eji oge n'enye Chineke òfùfè ma n'ekele Ya ụbọchị taa maka amara anyị si n'aka Ya natá, ka anyị kpee ekpere ka ịnụ ọkụ si n'igwe baa anyị n'obi ka anyị nyefee amara nke Oziọma a anyị natarà n'aka ndị anyị metarà kà ndị n'eso ụzọ ma jiri ndụ anyị bipụta Iwu Ikpeazụ Ahụ Kraịst Nyerè Anyị.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Kedụ kà ị gà-esi bie izu ikpeazụ nke ndụ gị ma ọ bụrụ na ị mà na ọ bụ izu ikpeazụ gị? Izu ikpeazụ Jizọs nọ n'ụwa n'anụ ahụ jupụtarà n'oge gasị ana apụghị ichefù, amụma gasị emezurù, ekpere jikọrọ obi Chineke, mkparịta ụka dị omimi, ihe emerè èmé gasị ná-arụtụ́ aka n'ihe, na ihe meré emé gasị gbanwerè ụwa. E merè ka ọ malite na ụbọchị Monde dị́ tupu Ista abịa, kwa ụbọchị nke Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Akwụkwọ Nsọ a Life.Church wepụtarà nà-eduru gị gazuo akụkọ ihe ná-emenụ́ na Izu Nsọ.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere Life.Church, biko gaa na: www.life.church