Akụkọ Nke IstaIhe Nhụchatụ

TUUSDE
N'ihe onyonyo nke ebe ana akọ osisi vaịn, anyị ga-agbarírí mbọ ịmata ndị anyị bụ. Anyị bụ alaka osisi vaịn ahụ. Otu ọrụ naanị dịịrị anyị bụ ijigidesì Jizọs ike, bụ osisi vaịn ahụ. N'imé nkè ahụ anyị pụrụ imezu ihe naanị e jiri kee anyị: ịmị mkpụrụ. N'ezie ọrụ niile banyere ugbo vaịn ahụ bụ nke onye-nlekọta ihe a kụrụ akụ n'arụ. Onye nlekọta a bụ Chineke-Nna. Ọ bụghị m. Ọ bụghị gị. Ọrụ anyị bụ̀ ịnọgidesi-ike dị́ njikọ na osisi vaịn ahụ ka anyị wee kwe ka Ọ rụọ ọrụ site n'ime anyị. Nọrọ jụụ tụgharịa uche nà onye ịbụ na ihe a kpọrọ gị ka ị mee. Itapasí ike. Ịnọgidesi ike. Ịnọgidesi ike ná njikọ. Ijigidesí ike. Irapagidesí ike. Ha bụ naanị ihe a chọrọ ka ị mee, ọ dịghị ihe ọzọ.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Kedụ kà ị gà-esi bie izu ikpeazụ nke ndụ gị ma ọ bụrụ na ị mà na ọ bụ izu ikpeazụ gị? Izu ikpeazụ Jizọs nọ n'ụwa n'anụ ahụ jupụtarà n'oge gasị ana apụghị ichefù, amụma gasị emezurù, ekpere jikọrọ obi Chineke, mkparịta ụka dị omimi, ihe emerè èmé gasị ná-arụtụ́ aka n'ihe, na ihe meré emé gasị gbanwerè ụwa. E merè ka ọ malite na ụbọchị Monde dị́ tupu Ista abịa, kwa ụbọchị nke Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Akwụkwọ Nsọ a Life.Church wepụtarà nà-eduru gị gazuo akụkọ ihe ná-emenụ́ na Izu Nsọ.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere Life.Church, biko gaa na: www.life.church