Akụkọ Nke IstaIhe Nhụchatụ

MONDE
Akụkụ Akwụkwọ Nsọ a n'egosipụta otu n'ime nzube kachasịnụ maka obibi ndụ Jizọs n'ụwa, ịbụ ọmụmaatụ nke ihe a kpọrọ mmadụ otù Chineke siri chọọ ka anyị bie ndụ. Jizọs kwuru, "Meenụ̀ ka M si eme." Akụkụ kachasị dị ịtụnanya banyere iwu a bụ na ike iji bie ya ka ndụ so ya. Jizọs asịghị anyị bie ndụ ka Ọkpara Chineke site n'ike nke onwe anyị - mbilite n'ọnwụ Ya nyerè anyị ohere inweta ike Ya. Taa, nọrọ jụụ tụgharịa uche na ihe ọmụmaatụ Jizọs hapụrụ anyị. Gịnị kà ị ga-asị isa ukwu ndị mmadụ yiri kà ná mmekọrịta gị gasị na n'ọnọdụ gị gasị? Kedụ kà ị ga-esi jeere ndị mmadụ ozi n'ụzọ a kachasị dị nkịtị na nleda anya dịka Jizọs siri meere ndị enyi Ya?

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Kedụ kà ị gà-esi bie izu ikpeazụ nke ndụ gị ma ọ bụrụ na ị mà na ọ bụ izu ikpeazụ gị? Izu ikpeazụ Jizọs nọ n'ụwa n'anụ ahụ jupụtarà n'oge gasị ana apụghị ichefù, amụma gasị emezurù, ekpere jikọrọ obi Chineke, mkparịta ụka dị omimi, ihe emerè èmé gasị ná-arụtụ́ aka n'ihe, na ihe meré emé gasị gbanwerè ụwa. E merè ka ọ malite na ụbọchị Monde dị́ tupu Ista abịa, kwa ụbọchị nke Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Akwụkwọ Nsọ a Life.Church wepụtarà nà-eduru gị gazuo akụkọ ihe ná-emenụ́ na Izu Nsọ.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere Life.Church, biko gaa na: www.life.church