Akụkọ Nke IstaIhe Nhụchatụ

TỌRSDE
Hụ onwe gị kà ndị mbụ n'eso ụzọ Kraịst nọ ebe ahụ n'ele Ya anya mgbe Ọ nwụrụ. Obi gị gà-adị ntiwa. Uche gị gà n'ama jijiji. Ihe a abụghị ma ọlị ihe kwesịrị ime onye bụ Eze Ndị Juu. O kwesịrị ime ka ihe niile dị mma. Mezie ihe gbajiri agbaji. Weghachite ihe furu efu. Mana ugbu a, ọ ga-adị kà, olileanya niile ahụ ọ wụsacharà n'ala. Ihe niile emebisichaalá. Ọ dịghị ihe dizi mma. Were nwa oge taa bie ndụ n'ime ohere ahụ dị n'etiti obe na ili tọgbọ chakoo. Mgbe olileanya nyerè efe. Tupu amara abịa. Jiri mmetụta ahụ kwanye ekpere gị ọkụ ka ị n'ekpe ekpere gbasara onye i ma n'ebi ndụ kwa ụbọchị n'ime ngabiga dị otú ahụ. Rịọ Chineke ka O gosi gị ka ị ga-esi rute ha wee kpọọ ha òkù ka ha bịa sonyere gị na ihe mmemme gasị nke Ista na ngwụcha izu a.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Kedụ kà ị gà-esi bie izu ikpeazụ nke ndụ gị ma ọ bụrụ na ị mà na ọ bụ izu ikpeazụ gị? Izu ikpeazụ Jizọs nọ n'ụwa n'anụ ahụ jupụtarà n'oge gasị ana apụghị ichefù, amụma gasị emezurù, ekpere jikọrọ obi Chineke, mkparịta ụka dị omimi, ihe emerè èmé gasị ná-arụtụ́ aka n'ihe, na ihe meré emé gasị gbanwerè ụwa. E merè ka ọ malite na ụbọchị Monde dị́ tupu Ista abịa, kwa ụbọchị nke Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Akwụkwọ Nsọ a Life.Church wepụtarà nà-eduru gị gazuo akụkọ ihe ná-emenụ́ na Izu Nsọ.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere Life.Church, biko gaa na: www.life.church