Akụkọ Nke IstaIhe Nhụchatụ

Pọl derè na Ndị Filipaị 3 na ọ "chọrọ ịma Kraịst na ike nke mbilite n'ọnwụ Ya na mmekọrịta nke ịkekọrịta na ahụhụ gasị Ọ tarà, n'adị ka Ya n'ọnwụ." O nwerè ike iyi ka ịchọ inwe ahụmahụ nke ntaramahụhụ ndị a gabigará oké agaghị ekwe omume, mana ihe ebube akụkọ a n'enye bụ na anyị pụrụ ịmara Kraịst n'ezie. Mgbe anyị n'ahụ udo, ọñụ, ịdị jụụ n'ahụ na obi, na amara n'amuke n'etiti mbibi na ihe ike niile n'eme, i pụrụ ịhụ ịma mma dị́ n'ịdị ka Ya n'ọnwụ Ya. Ka obibi ndụ Ya si dị oké mfe n'ihi ntụkwasị obi Ya niile n'ebe Chineke nọ. O nweghị nsogbu ma ọ bụ nchegbu nke ụwa a ewezụga nne Ya O nyeferè n'aka ezigbote oyi Ya ka o lekọta ya. Naanị ihe onwunwe dị oké ọnụ O nwerè bụ akwa O n'eyi n'ahụ dabará n'aka onye nche n'agba chaa chaa. Ụdị obibi ndụ ahụ n'enweghị nkwakosí dị na ya. Ụdị nlekwasị anya ahụ nọgideré n'ihe Ọ bịara ime. Ụdị nraranye ahụ nye nzube Chineke. Ụdị ntụkwasị obi ahụ ana apụghị ịkwa aka O nwerè n'ebe Nna Ya nọ. Ha bụ ihe ndị agụụ anyị kwesịrị ịna adọgá nà.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Kedụ kà ị gà-esi bie izu ikpeazụ nke ndụ gị ma ọ bụrụ na ị mà na ọ bụ izu ikpeazụ gị? Izu ikpeazụ Jizọs nọ n'ụwa n'anụ ahụ jupụtarà n'oge gasị ana apụghị ichefù, amụma gasị emezurù, ekpere jikọrọ obi Chineke, mkparịta ụka dị omimi, ihe emerè èmé gasị ná-arụtụ́ aka n'ihe, na ihe meré emé gasị gbanwerè ụwa. E merè ka ọ malite na ụbọchị Monde dị́ tupu Ista abịa, kwa ụbọchị nke Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Akwụkwọ Nsọ a Life.Church wepụtarà nà-eduru gị gazuo akụkọ ihe ná-emenụ́ na Izu Nsọ.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere Life.Church, biko gaa na: www.life.church