Akụkọ Nke IstaIhe Nhụchatụ

WENESDE
Tupu Jizọs agaa njem obe Ya, O nwerè arịrịọ ikpeazụ. Ọ maarà ihe n'eche Ya ihu ụbọchị n'esote, mana ekpere Ya ikpeazụ abụghị maka Onwe Ya, kama ọ bụ maka gị. Maka anyị niile. Jizọs kpeerè ndị n'eso ụzọ Ya ekpere. Ekpere Jizọs bụ mpio mara mma iji nyobà anya na uche Chineke banyere anyị. Bụ̀rụ́ azịza nye Ekpere Jizọs n'izu a. Gụọ ekpere Ya ahịrị kwa ahịrị ka ị mara ka ị ga-esi eme ya. Na ngwụcha izu a, ka Ndị Nke Kraịst zuru ụwa gbakọtarà ọnụ ime ememe mbilite n'ọnwụ Ya, ka anyị chọọ ụzọ gasị anyị na Chineke iji dị n'otu na anyị na ndị ọzọ iji dị n'otu. Mee ekpere Jizọs ka ọ bụrụ ekpere gị, na ụwa dum ga-ahụ ebube Ya wee bịa mara Ya site na ịdị n'otu anyị na ịhụnanya Chineke.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Kedụ kà ị gà-esi bie izu ikpeazụ nke ndụ gị ma ọ bụrụ na ị mà na ọ bụ izu ikpeazụ gị? Izu ikpeazụ Jizọs nọ n'ụwa n'anụ ahụ jupụtarà n'oge gasị ana apụghị ichefù, amụma gasị emezurù, ekpere jikọrọ obi Chineke, mkparịta ụka dị omimi, ihe emerè èmé gasị ná-arụtụ́ aka n'ihe, na ihe meré emé gasị gbanwerè ụwa. E merè ka ọ malite na ụbọchị Monde dị́ tupu Ista abịa, kwa ụbọchị nke Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Akwụkwọ Nsọ a Life.Church wepụtarà nà-eduru gị gazuo akụkọ ihe ná-emenụ́ na Izu Nsọ.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere Life.Church, biko gaa na: www.life.church