Gị Bụ́ Onye A Họọrọ: N'echetara Onwe Gị Maka Oziọma Kwa ỤbọchịIhe Nhụchatụ

“Ike agwụla m, ana m ebibi ihe niile.”
Edemede a pụtara na ekwentị-mkpanaaka enyi m Ryan site na nọmba ọ n'amaghị na abalị Tusdee n'elekere asatọ. O techabeghì aka o sutucharà ụmụ ya ọnụ abalị-ọma ka ha wee rahụụ ụra ma ya anọdụ ala n'elu oche izu nwa ike n'ihi ogologo ọrụ ọ rụrụ n'ụbọchị.
“Enyi m, onye ka ị bụ̀?” ka o deghachirì ozi ahu.
Aha onye dere ozi ahụ bụ Sera. Ọ chọpụtara na ozigara ozi ahụ na nọmba onye ọzọ, o rịọrọ mgbaghara ozugbo.
“Chèrétú,” Ryan deghachirì ya. "Enwere m ike inyere gị aka."
Ha malitere izigarità onwe ha ozi ihe dị ka ọkara otu awa. Sera kọọrọ Ryan akụkọ ndụ ya. Akụkọ ya dị oké mwute. Ihe ikpeazụ bịara nyakwasí n'ọnyá niile dị ya n'obi bụ na enyi ya nwoke si na ọ chọghịzi ka ha abụọ dị na mmekọrịta. Ryan gbalirì ime ka Sera mara banyere ịhụnanya Jizọs nwerè n'ebe ọ nọ na uru ọ bara n'anya Chineke agbanyeghị ihe niile o nọ n'echè. Ọ gwara ya ka ọ ghara ịtụkwasị ndụ ya n'elu echiche nwata nwoke dị afọ iri abụọ na abụọ.
"Ị̀ pụghị inyere m aka," ka Sera zaghachirì ya, "Aṅụchaala m ọgwụ niile dị n'ime otu kárámá."
Ryan rịọrọ ya ka ọ gwa ya ebe ọ nọ. Ọ gwara ya na ya na nwunye ya ga-akpọrọ ya gaa ụlọ ọgwụ. Sera gwara ha, ha kpọgakwarà ya n’ụlọ ọgwụ, bụ́ ebe ndị dọkịta gwọrọ̀ Sera ozugbo ma zọpụta ndụ ya.
N’ime ọnwa ndị soterenú, eji nwayọ meghe anya Sera ka ọ hụ otú o si baa uru n’ime Kraịst. O mecharà gaa mahadum Ndị Kraịst ka ọ gbasoo atụmatụ Chineke maka ndụ ya. Chineke agbapụtawo ya; O werewo ndụ nke ụwa anyị sìrì na ọ abaghị uru—wee tụgharịa ya. Sera bara uru Chineke ịnwụ maka ya.
Mgbe otu enyi m nà-enweta MBA ya maka agụmakwụkwọ azụmaahịa, prọfesọ ná-akụzirí ha ikonomiks kụbara n'ime isi ha otu ukpuru bụ isi: A na-ekpebi uru ihe bara daberé na ihe mmadụ pụrụ ịkwụ maka ya.
Ụgwọ á kwụrụ maka mgbapụta anyị bụ ọbara nke Jizọs Kraịst, Ọkpara Chineke. O nwerè ihe pụrụ ịdị oké ọnụ ahịa karịa nke ahụ? O nwerè ihe ọbụla dị ike ime ka ị baa uru karịa?
Anyị niile na-alụ ọgụ kwa ụbọchị iji gbakwasị ụkwụ anyị n'ụgwọ Chineke kwụrụ maka anyị. Onye ọbụla nwerè ụdị ọnụ ahịa ha na-eji atunyere uru ha bara. Anyị na-eji ọnụ ahịa nke mmezu-ihe nke ndụ, ezinụlọ, ọdịdị, akụ na ụba, agbụrụ, agụmakwụkwọ, ikike nke ịbụ onye ndú, mmetụta anyị n'ọhaneze, ma ọ bụ "tinye dịka i chetarà."
Ụmụ mmadụ na-achọsi ike igosi uru ha bara ma ọ bụ n'ebi n'ịda mbà n'obi n'ihi na ha cherè na ha enweghị uru.
Nke a bụ otu n'ime mmetụta dị ike nke ikwusa Ọziọma nye mkpụrụ obi gị. Ị na-echetara mkpụrụ obi gị uru ọ bara n'ime Kraịst site n'ichetara onwe gị ọnụ ahịa dị elu nke a kwụrụ iji gbapụta gị.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Gịnị gà-eme ma ọ bụrụ na gị eteta-ụra kwa ụbọchị wee n'echetara onwe gị maka Oziọma? Ihe òfùfè a dị ụbọchị asaa chọrọ nnọọ inyere gị aka ime otù ahụ! Ọ bụghị naanị na Oziọma na-azọpụta anyị, Ọ na-akwadokwa anyị ruo ná njedebe nke ndụ anyị. Odee na Onye N'ekwusa Oziọma Matt Brown meberè atụmatụ ihe ọgụgụ a daberé na akwụkwọ ihe òfùfè dị ụbọchị iri atọ nke Matt Brown na Ryan Skoog derè.
More