Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Gị Bụ́ Onye A Họọrọ: N'echetara Onwe Gị Maka Oziọma Kwa ỤbọchịIhe Nhụchatụ

Chosen: Remind Yourself Of The Gospel Everyday

ỤBỌCHỊ 4 NKE 7

O nwerè mgbe otu chọọchị dị n’ime obodo merè njem Oziọma iji wuo chọọchị n’ime ime obodo dị na Rọshịa. Ha ji nkume ndị si n’otu ụlọ mkpọrọ Rọshịa a gbahapụrụ agbahapụ na-ewu yabụ ụlọ òfùfè. Ihe nke dị ezigbo ike n'ebube!

A kpachaarà anya nke ọma iji chekwaa nkume ndị ahụ. Ka ha na-ewepụta otu n’ime nkume ndị ahụ burú ibù, ha chọpụtara otu nkume nwere oghere miri emi n'ime ya edeberè nwa obere ihe eji anụ mmiri; N’ime nwa ihe ahụ eji aṅụ mmiri ka e derè na mpempe akwụkwọ: “Anyị bụ̀ ìgwè Ndị Kraịst nke ndị Kọmunist na-amanye iburú nkume chọọchị anyị wee wuo ụlọ mkpọrọ ebe anyị ga-anọgide ruo mgbe anyị nwụrụ. Ekpere anyị bụ̀ na otu ụbọchị, a ga-eji nkume ndị a wuo ụlọ ụka ọzọ.”

Mgbe Kraịst sirì na ndị nwụrụ anwụ bilie, Ọ họpụtara ibu ụzọ kpughee Onwe Ya nye Meri Magdalin. N'oge ahụ, akaebe nke nwanyị adịghị eguzo ma ọlị n'ụlọ ikpe. Mana Jizọs họpụtara otu nwanyị dị nkịtị, dara ogbenye, dị ka onye-akaebe mbụ Ya, na-egosi ụwa otú nwanyị n'enweghị ihe eji ya wee kpọrọ nweré ozi kachasị ukwuu n'ụwa, si nwee ike imebi alaeze ukwu kachasị ukwuu na akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Ma ugbu a, taa, alaeze Chineke nà-eto na-anabata ọtụtụ puku mmadụ kwa ụbọchị, ndị ikom na ndị inyom ná-enyefe ndụ ha n'aka Kraịst, mana alaeze Rom adaala nwụọ pii.

Akụkọ Oziọma bụ akụkọ nke ndị nkịtị ná-agbá ama ma na-ahụ ike pụrụ iche nke mbilite n’ọnwụ. Mgbe ọbụla ị na-eche na ị dara ogbenye, na i dịghị ike, Kraịst ahụ a kpọlitere n’ọnwụ na-adị njikere ikpughe ike Ya site n’aka gị. Akụkụ niile nke ndụ gị nke i na-eche na ọ dịghị mkpa bụ kpọmkwem ebe Kraịst na-ele anya ime ọrụ ebube mbilite n'ọnwụ ọzọ.

Kraịst rụrụ ọrụ ebube Ya kachasị ukwuu n'etiti ndị nkịtị, n'ime obodo kacha nta, n'oge nkịtị. Imirikiti ọrụ ebube Jizọs rụrụ n'ụwa abụghị na n'ụlọ nsọ Jeruselem kama ọ bụ n'ebe nkịtị nke ụmụ obere obodo. Ọ bụrụ na ị nọ n'ebe na-enweghị nkwuwa, màrá na ịnọ ebe zuru okè, ebe ike mbilite n'ọnwụ nke Chineke ga-apụta ìhè.

Mgbe ị malitere ịna agwa obi gị Oziọma kwa ụbọchị, ị ga-amalite ịhụ mbilite n'ọnwụ n'ime ụbọchị gị nile, n'ebe ị n'aga, na n'ime ndụ ndị mmadụ.

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Chosen: Remind Yourself Of The Gospel Everyday

Gịnị gà-eme ma ọ bụrụ na gị eteta-ụra kwa ụbọchị wee n'echetara onwe gị maka Oziọma? Ihe òfùfè a dị ụbọchị asaa chọrọ nnọọ inyere gị aka ime otù ahụ! Ọ bụghị naanị na Oziọma na-azọpụta anyị, Ọ na-akwadokwa anyị ruo ná njedebe nke ndụ anyị. Odee na Onye N'ekwusa Oziọma Matt Brown meberè atụmatụ ihe ọgụgụ a daberé na akwụkwọ ihe òfùfè dị ụbọchị iri atọ nke Matt Brown na Ryan Skoog derè.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Think Eternity maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.thinke.org

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara