Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Gị Bụ́ Onye A Họọrọ: N'echetara Onwe Gị Maka Oziọma Kwa ỤbọchịIhe Nhụchatụ

Chosen: Remind Yourself Of The Gospel Everyday

ỤBỌCHỊ 1 NKE 7

Gịnị gà-eme ma ọ bụrụ na i teta kwa ụbọchị we na-echetara onwe gị maka Oziọma? 

Ọ bụrụ na i dị ka m, i gà n'enwe ọnwụnwa nke ịghara idebe oké mkpa n'Oziọma ka o kwesịrị, wee n'akwụsị ịmụgharị Ya n’ihi na Ọ matala gị ahu. Anyị nà-echekwá Ya na akụkọ ihe mere n'oge gara aga nke ndụ anyị ma na-agbalịsi ike ịhapụ Ya n'azụ we gaa n'iru. Mana anyị kwesịrị ịna-anụ Oziọma ụbọchị niile nke ndụ anyị dị ka anyị si nụ Ya n’ụbọchị mbụ. 

.

Ọ bụrụ na anyị na-echetara onwe anyị maka Oziọma kwa ụtụtụ, anyị ga-eteta ụra ma bie ndụ n’obi ụtọ n’ihi na e merielarị agha ahụ kacha sie ike anyị ga-eche ihu n'ụbọchị ahụ. 

Olee otú ndụ gị pụrụ isi dị iche ma ọ bụrụ na ị na-ekwusa oziọma n'obi nke gị mgbe nile? 

E nwerè ọtụtụ ụzọ Oziọma si emetụta ma na-akpụzi ndụ anyị kwa ụbọchị. Anyị niile kwesịrị icheta abam uru ndị a mgbe nile, ike Chineke dịkwa anyị mkpa ịghọtakwu ha. 

Ọtụtụ ndị kwere ekwe nà-echè na Oziọma bụ akụkọ ochie. Oziọma abụghị ihe anyị ga-asị na anyị anụla Ya nke ukwuu; Oziọma abụghị ihe anyị ga-asị na anyị anuzùolá Ya. Dị ka ọtụtụ akụkụ nke dayamọnd mara mma, otu a ka Oziọma si nwee ịma mma dị iche iche nke n'enweghị ngwụcha, nke na-agaghị agwụ agwụ. Ka anyị na-elebakwu anya n’Oziọma, otú ahụ ka anyị ga na-enwekwu afọ ojuju na okwukwe anyị. 

Ọ dị mkpa ka anyị na-echeta mgbe nile ihe nile Chineke meerè anyị n’Oziọma, n’ihi na Oziọma na-akwali ma na-akpali ọchịchọ anyị irubere Chineke isi na ijere Ya ozi. Mgbe anyị hụrụ ọtụtụ ihe O meworò— ihe O nyeworò anyị n’ime Ọkpara Ya—anyị apụghị ime ihe ọzọ ná abụghị i gbanwè ma nwee mkpali inye Ya ndụ anyị nile. N'ihi na ọbụna mgbe anyị bụ ndị n'enweghị ike na ndị mmehie rìrì ná-adọgá iso Onye-nzọpụta zuru okè, Oziọma na-echetara anyị otú e si hụ anyị n’anya na otú Chineke si arụ ọrụ n’ime anyị iji nyere anyị aka iso Ya. 

Ọ dịghị ihe dị mkpa nke ukwuu ná ndụ gị bụ́ Onye Nke Kraịst karịa ichetarà obi gị mgbe nile banyere eziokwu nke Oziọma. 

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Chosen: Remind Yourself Of The Gospel Everyday

Gịnị gà-eme ma ọ bụrụ na gị eteta-ụra kwa ụbọchị wee n'echetara onwe gị maka Oziọma? Ihe òfùfè a dị ụbọchị asaa chọrọ nnọọ inyere gị aka ime otù ahụ! Ọ bụghị naanị na Oziọma na-azọpụta anyị, Ọ na-akwadokwa anyị ruo ná njedebe nke ndụ anyị. Odee na Onye N'ekwusa Oziọma Matt Brown meberè atụmatụ ihe ọgụgụ a daberé na akwụkwọ ihe òfùfè dị ụbọchị iri atọ nke Matt Brown na Ryan Skoog derè.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Think Eternity maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.thinke.org

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara