Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Gị Bụ́ Onye A Họọrọ: N'echetara Onwe Gị Maka Oziọma Kwa ỤbọchịIhe Nhụchatụ

Chosen: Remind Yourself Of The Gospel Everyday

ỤBỌCHỊ 6 NKE 7

N'otu obodo nta nke uzuzu juru dị na Nepal nke dị nso na ndò nke Ugwu Everest, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ pasentị 80 nke ụmụ agbọghọ ka a ga-eresị n'ụlọ akwụna n'ihi na ha bụ ndị mmadụ ọkwá ha kachasị dị ala na mba ahụ, ndị Badi. Okpukpe ha na-akụzi nà, ná ndụ ha gara aga ọ ga-abụrịrị na ha chịkọtarà njọ kwa njọ mere Karma jiri kpebie ịta ha ahụhụ wee zighachi ha n'ụwa n'òtù ha. Ndị mmadụ adịghịdị enyere ha aka, n'ihi na ha achọghị igbochi Karma ịta ha ahụhụ kwesịịrị ha. N'ihi ya, ụmụ agbọghọ Badi bụ ụfọdụ n'ime ndị a kachasị ere ere n'elu ụwa nile. Agbụrụ na ọkwá a mụrụ ndị Badi na ya gosirì ma n'akwado na a ga-emeso ha omume dị ala karịa nkịta—iji ha mee ihe ọbụla n'agbanyeghị ka o si rụọ arụọ, ree ha ma megbuo ha. 

Ọ bụ ebe a ka enyi m Ryan zuterè Landana, bụ́ nwa afọ iri mara mma. Nna ya ekwetala ire ya n’ụlọ akwụna ndị India. Nne ya enweghị ike ịnagide echiche ahụ wee gbalịa igbochi di ya ire nwa ya nwanyị dị oké ọnụ ahịa. Ma nwoke ahụ achọghị ihe dị otu a. Ọ malitere iti nwunye ya ihe n’ihi na ọ chọghị ire nwata ahu. 

Mgbe Ryan na ndị òtù ya chọpụtara nke a, ha mere ngwa ngwa, ha na ndị ọrụ na-elekọta mmadụ na ndị mmanye iwu, wee napụta Landana n'aka nna ya. Ha bugarà Landana n'ụlọ nchekwa ebe a na-echekwa ụmụ agbọghọ dịka ya, ebe enyerè ha ekpomo ọkụ, nri, na ịhụnanya. Landana nụrụ Oziọma nke Kraịst. Ọ nụrụ ka e si n’aka Jizọs kpọbata anyị n’ezinụlọ Chineke. Nke a bụ akụkụ kachasị dị ike nke Oziọma maka ọtụtụ ndị nọ n'akụkụ ụwa ya.

Mgbe ọ na-ekesa Oziọma Jizọs nye ụmụ agbọghọ Badi na ndị ọzọ, enyi m Ryan na-agwa ha si, “Oziọma na-akụzi na aha ikpeazụ gị abụghịzi Badi, aha gị abụghịzi Jarla Badi; ọ bụ Jarla ‘Kraịst’ n’ihi na ị nọ n’ezi-na-ụlọ Kraịst ugbu a, ị nọ n'agbụrụ Ya ugbu a.” Landana nwerè nwuli-obi na obi jupụtara n'olileanya wee legide ya anya. "Nke a o nwerè ike ịbụ eziokwu?" Ka ọ jụrụ. "Ee, ọ bụ eziokwu kachasị eziokwu n'ụwa niile!"
 

Landana ji obi ụtọ sonye na ezinụlọ nke Chineke, hapụ ihere nke ezinụlọ ya, nke ọgbara ya, nke ọbara ya. Chineke ghọrọ nna ya, ịhụnanya dị iche na nke nna chọrọ ire obere nwa ya nwanyị. Ọ bụ Chineke nke dị njikere ire Onwe Ya mkpụrụ-ego ọlaọcha iri atọ iji zọpụta obere nwa Ya nwanyị. 

Ndị ọgbara ọhụrụ nke oge a na-ele Iso Ụzọ Kraịst anya wee na-eche, “Gịnị kpatara ọbara? Kedụ ka ha ga-esi n'abụ abụ banyere ọbara Jizọs?" Mana ndị ahụ a zụtara site n'ọbara nke Kraịst maarà na anyị na-ekekọrịta ugbu a nkekọ nke na-aga omimi karịa usoro ọbara anyị n'ụwa a. Jizọs na-akpọ anyị òkù ka anyị bata n’ezinụlọ ọhụrụ na ọdịnihu ọhụrụ. Nke a merè Ndị Kraịst ji enwe mmasị iche echiche banyere ọbara Kraịst. 

Oziọma a n'agabiga oké nke ikpochapụ mmehie anyị gara aga; Ọ na-ekpochapụ kwa ihere nke nna nna anyị dum, agbụrụ anyị, ezi na ụlọ anyị. Ị bụghịzi akụkụ nke ezinụlọ ụwa a ọzọ; anyị abanyela n'ezinụlọ nke eluigwe. Ọbara Jizọs egosipụtawo na anyị bụ̀ ezinụlọ nke eluigwe ruo mgbe ebighị ebi. Anyị nwerè njirimara ezinụlọ ọhụrụ, akarà ezinụlọ ọhụrụ, ebe obibi ọhụrụ, ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ọhụrụ, aha ikpeazụ ọhụrụ. 

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Chosen: Remind Yourself Of The Gospel Everyday

Gịnị gà-eme ma ọ bụrụ na gị eteta-ụra kwa ụbọchị wee n'echetara onwe gị maka Oziọma? Ihe òfùfè a dị ụbọchị asaa chọrọ nnọọ inyere gị aka ime otù ahụ! Ọ bụghị naanị na Oziọma na-azọpụta anyị, Ọ na-akwadokwa anyị ruo ná njedebe nke ndụ anyị. Odee na Onye N'ekwusa Oziọma Matt Brown meberè atụmatụ ihe ọgụgụ a daberé na akwụkwọ ihe òfùfè dị ụbọchị iri atọ nke Matt Brown na Ryan Skoog derè.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Think Eternity maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.thinke.org

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara