Gị Bụ́ Onye A Họọrọ: N'echetara Onwe Gị Maka Oziọma Kwa ỤbọchịIhe Nhụchatụ

Enyi m Ryan na-akọ akụkọ banyere otu nwoke aha ya bụ Mazị Bi bụ́ prọfesọ na Mahadum Beijing, nke a maarà dị ka “Harvard nke China.” O merè ihe ọchị nye ụmụ akwụkwọ nọ na klas ya gbasara otù ndị Kọmunist. Otu n'ime ụmụ akwụkwọ ya ahu we kọọrọ ndị uwe ojii ihe ọchị ya. N'echi ya ndị uwe ojii wakpọrọ Mazi Bi n'ụlọ ọrụ ya wee dọkpụrụ́ ya gaa n’ụlọ mkpọrọ ndị Kọmunist dị ezigbo anya n'atụ oké oyi—enyeghị ya ịdọ aka ná ntị ọbụla, ekpeghị ya ikpe.
O tetarà n'ụtụtụ ahụ dị ka onye prọfesọ na-achị n'ọkwá otu n'ime agụmakwụkwọ ama ama n'ụwa. Ka abalị n'erute, ya nwà bụ̀ onye nọ n'ime ụlọ mkpọrọ. Ụlọ mkpọrọ ndị China n'oge a bụ ụfọdụ n'ime ebe kasị njọ n'ụwa—mpaghara gasị dị egwù nke ọrịa, ịta ahụhụ, na ọnwụ. Mazị Bi ngwa ngwa dabarà na nkụda mmụọ na obi arịrị. Nkụda mmụọ ya buterè echiche igbu onwe ya n'ime izu ole na ole. Otu ehihie, n’oké mwute, ọ kpọtara onwe ya na windo nke ọnụ ụlọ mkpọrọ ya ahụ dị ogo asatọ. Ndị China etinyeghị windo n'ụlọ ndị dị elu nke ụlọ mkpọrọ ha. Ọ bụrụ na onye mkpọrọ ekpebie ịtụfu onwe ya n’ọnwụ, nke ahụ a bụghị nsogbu.
Obi Mazi Bi nọ n'eti kpụmkpụm ka o lepụrụ anya na-echè isi na windo ahụ mapụ. Mana mgbe ahụ, nke a merè. Ọ nụrụ otu obere olu ka ọ sịrị, “Agala. Agala. Agala.” Ọ nọghachikwurù ala n'etiti ọnụ ụlọ mkpọrọ ya, enweghị olileanya.
N'ebe ahụ, n'ala simenti siri ike, ka echiche jụrụ ya obi, o wee cheta otu enyi ya, onye prọfesọ si mba ofesi, onye bụ́ Onye nke Kraịst, kekọrịtará ya Oziọma. Mazị Bi kpere ekpere si, “Jizọs, ọ bụrụ na Ị dị ndụ, biko wetara m mgbaghara na udo nke enyi m gwara m na Ị kwerè na nkwa. Ị mee ya, m ga-enye ndụ m n'ijere Gị ozi.”
Ka o lelirì anya elu, ọ sịrị, “Eluigwe charà anụnụ anụnụ n'ụzọ m na-ahụtụbeghị ya na mbụ, anyanwụ wee dị m ka ọ n'acha oké ọcha site na windo ụlọ mkpọrọ m n'ụzọ m na-ahụtụbeghị ya na mbụ, ọñụ ewee si m n'ime obi rilie ka m n'enwetubeghị na mbụ.”
Prọfesọ a ama ama tụpụrụ ihe niile ọ na-eche wee tie mkpu, sị, “Enwere m ọdịnihu dị mma n’ime Jizọs Kraịst!” Ndị nche nụrụ iti mkpu ya wee jiri obi ọjọọ gwa ya ka ọ mechie onu. Ma ọ pụghị ijide ọṅụ ya. Ọ nọ na-etigide mkpu ugboro ugboro ruo mgbe ha batarà n’ọnụ ụlọ mkpọrọ ahụ tie ya ihe.
Onye nọ n’ụlọ mkpọrọ atohapụrụ site n’ikwere n'Oziọma Jizọs nweerè onwe ya karịa onye na anọghị n'ụlọ mkpọrọ nke n'enweghị Oziọma ahụ.
Emechara tọhapụ Mazi Bi n'ikpeazụ, ọ wee malite iwu ọtụtụ ụlọ maka ụmụ-mgbei n'ime ime China, na-elekọta ndị ogbenye ma na-eduba ọtụtụ ndị n'ime Kraịst. O nwerè ọdịnihu dị mma n'ime Jizọs Kraịst. Ruo taa, ọṅụ ya na-efe efè ma i zute ya. Ọ ga-agwakwa gị na ọṅụ o nwerè n’ụlọ mkpọrọ bụ otu ihe ahụ o nwerè ruo taa.
Ndị mmadụ na-enwe mmetụta mgbe ụfọdụ na ha nọ n'ụlọ mkpọrọ nke onwe ha. Ha tọrọ atọ n'echiche, àgwà, omume, na nhụsianya gara aga nke na-agaghị ekwe ka ha laa.
Oziọma na-akụziri anyị na ụlọ mkpọrọ kacha njọ bụ nke anyị ji aka anyị meere onwe anyị. A kuchirì ụzọ nke ụlọ mkpọrọ a jiri ihe ọjọọ niile anyị n'eche banyere onwe anyị, na o nwerirì ihe na-adịghị mma banyere anyị, na anyị adịghị mma ma ọlị. Anyị a n'ebú nke a dị ka ụdọ̀ n'olu anyị. Ọ bụ ọnọdụ dị mwute nke ụmụ mmadụ.
Nke a gà-agbanwe naanị ma ọ bụrụ na ihe siri ike emee.
Oziọma bụ̀ ihe kachasi sie ike mere eme. Ọ bụ obe na-agba ọbara. Ọ bụ ọnwụ Chineke n’Onwe Ya n’ihi anyị. Ọ bụ mbibi nke ọnwụ onwe ya ná mbilite n'ọnwụ dị ebube iji gosi ịhụnanya na ike Chineke ebighị ebi kwa ebighị ebi.
Akwụkwọ Nsọ na-echetara anyị na anyị gà-etinyeriri uche nke ọma n'ihe anyị nụrụ, karịsịa ma a bịa n'Oziọma (Ndị Hibru 2:1). Ozizi kacha mkpa ị gà-ekwusa bụ̀ nke i na-ekwusa n’obi nke gị, n'echetara obi gị kwa ụbọchị, “Enwere m ọdịnihu dị mma n’ime Jizọs Kraịst.”
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Gịnị gà-eme ma ọ bụrụ na gị eteta-ụra kwa ụbọchị wee n'echetara onwe gị maka Oziọma? Ihe òfùfè a dị ụbọchị asaa chọrọ nnọọ inyere gị aka ime otù ahụ! Ọ bụghị naanị na Oziọma na-azọpụta anyị, Ọ na-akwadokwa anyị ruo ná njedebe nke ndụ anyị. Odee na Onye N'ekwusa Oziọma Matt Brown meberè atụmatụ ihe ọgụgụ a daberé na akwụkwọ ihe òfùfè dị ụbọchị iri atọ nke Matt Brown na Ryan Skoog derè.
More