Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Gị Bụ́ Onye A Họọrọ: N'echetara Onwe Gị Maka Oziọma Kwa ỤbọchịIhe Nhụchatụ

Chosen: Remind Yourself Of The Gospel Everyday

ỤBỌCHỊ 3 NKE 7

Otu n'ime ụzọ ìzìzì anyị n'esi azụ mkpụrụ obi anyị ịhụ Chineke n'anya bụ̀ site n'ikwusa Oziọma nye mkpụrụ obi anyị. Ka mkpụrụ obi gị na-ahụwanye obe Jizọs, otu a ka ekele na nkwanye-ùgwù gà-abawanye n'ime gị. E merè ụmụ mmadụ òtù ahụ imeghachi omume nye ichu àjà. Ọ gà-esi ike ichepụtà ihe karịrị àjà nke Jizọs chụrụ.

Ọ bụrụ na ị na-eme njem n’ụwa, otu nkebi ahịrịokwu nke zuru ụwa ọnụ n’ụdị ọdịbendị nile—bụ̀ ahịrị a maarà nke ọma site n’Abụ Ọma 103:1: “Gọzie Onye-nwe-anyị, mkpụrụ obi m.”

Ka m kebie ahiriokwu a ka aghọta ya nke ọma. Devid n'azụ mkpụrụ obi ya site n'izi ya Oziọma. Devid gwarà mkpụrụ obi ya mmetụta o kwesịrị inwe na otú ọ ga-esi nye Oziọma nzaghachi: Mkpụrụ obi m, gọzie Chineke, ma ị chọrọ ma ọ bụ na ị chọghị. Ọ bụghị naanị na ọ na-abụ ahịrị mara mma; kama ọ na-agwa onwe ya okwu, ọ na-ama mkpụrụ obi ya aka ka o bilite elu. Akwụkwọ Nsọ na-akọwa àgwà a, na-asị, “Devid merè ka onwe ya dị ike n’ime Onye-nwe-anyị” (1 Samuel 30:6, esv).

N'ụzọ dị mwute, ihe omume a nke ndị n'eso Ụzọ Kraịst abụrụlá ihe furu efu, ihe ọzụzụ mara mma akwụsịrị ime. Kama ị gà-eburu ọnọdụ gị ugbu a, omenala na-agbanwe agbanwe oge nile, ndị gbara gị gburugburu n'enye gị nsogbu, ma ọ bụ, nke ka njọ, ihe ị n'ahụ n'ebe mgbasa-ozi ọhaneze, n'echiche, lee mkpụrụ obi gị anya n'anya ma gwa ya ka ọ lekwasị anya n'obe, na mbilite n'ọnwụ. Nye mkpụrụ-obi gị iwu ka ọ ṅụru site n’obiọma nke Kraịst, Onye naara ihe mgbu na mmerụ ahụ n'ubu Ya ma burú ibu nke mmehie gị.

Mgbe ụfọdụ ị gà-amanye mkpụrụ obi gị iwu ka o lee anya. Jọn Onye Na-eme Baptizim tìrì mkpu si mbara igwe na ala, “Leenụ̀!” ma ọ bụ “Unu gà-elerírí anya!” Ọ sịrị: “Leenụ̀ Nwa-atụrụ Chineke, Onye na-ebupụ mmehie nke ụwa!” (Jọn 1:29). Nke a bụ iwu kwa ụbọchị. Anyị gà-elerírí anya! Légidé anya n'obe ebe Jizọs tara ahụhụ nke ukwuu n'ihi mmehie Ọ na-emeghị ka ị we nwee ike ịṅụrị ọṅụ nke ukwuu n'ezi omume n'ekwesighírí gị.

Oziọma gà-aghọ̀rọ́ mkpụrụ-obi anyị nri kwa ụbọchị, na-ewusi obi anyị ike. Ọ ga-esiri anyị ike ime mkpesa, nwee obi nkụda maka onwe anyị, ma ọ bụ jupụta na nchekasị mgbe mkpụrụ obi anyị hụrụ̀ ka ọbara na-agbadà ihu Kraịst ogwu dụwasịrị. Ekele na-ewuli elu n'ime obi anyị mgbe anyị na-eme nke a n'ụbọchị dum.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Chosen: Remind Yourself Of The Gospel Everyday

Gịnị gà-eme ma ọ bụrụ na gị eteta-ụra kwa ụbọchị wee n'echetara onwe gị maka Oziọma? Ihe òfùfè a dị ụbọchị asaa chọrọ nnọọ inyere gị aka ime otù ahụ! Ọ bụghị naanị na Oziọma na-azọpụta anyị, Ọ na-akwadokwa anyị ruo ná njedebe nke ndụ anyị. Odee na Onye N'ekwusa Oziọma Matt Brown meberè atụmatụ ihe ọgụgụ a daberé na akwụkwọ ihe òfùfè dị ụbọchị iri atọ nke Matt Brown na Ryan Skoog derè.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Think Eternity maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.thinke.org

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara