Isi Ike, Nke Si N'aka Lisa BevereIhe Nhụchatụ

Chineke n'agwa gị si, “Ị bụ̀ adamant M.” O nweghị ihe o merè ma ọ bụrụ na ọ dịghị gị ka ị dị otú ahụ ugbu a; eji ọrụ Kraịst ana apụghị imebi emebi kpuchie gị gburugburu dịka ngwugwu mara mma. Gee ntị nụ̀rụ́ ụfọdụ ihe Chineke n'ekwu n'isi gị ụbọchị taa:
Ị bụ̀ adamant M, siri ike ma dịkwa ihò ka enyo—ndị mmadụ n'èlé anya na gị wee hụ Kraịst site n'ime gị.
Ị bụ̀ adamant M—Mmụọ nke Kraịst bì n'ime gị iji mee ka ị kwụrụ chịm na dị akwànwùghị aka.
Ị bụ̀ adamant M—i nwerè mkpụrụ obi nke n'ere ka ọkụ!
Jizọs bịara ka O mee anyị baptizim jírí Mmụọ Nsọ na ọkụ. Nke a bụ baptizim anyị gà anatarirì. Mgbe a mụrụ anyị ọzọ nke ime mmụọ, obi anyị nwụrụ́ anwụ́ bụ nke n'adị ndụ ọzọ site na nré ọkụ na ìhè nke ịhụnanya Ya dị ebighị ebi.
Ị maghị ihe ị yirì ka ya n'ime mmụọ. Ị chè na ọ bụ̀ okwu nkịtị ka ịna ekwu, mana okwu ndị ị n'ekwu bụ̀ ọkụ na burú ọkụ! Ịna ekwu ihe ndị ji ìhè na eziokwu n'ekewapụ̀ site n'ahụ na ndụ ndị mmadụ ụgha gasị onye iro jirì kee ha agbụ ogologo oge. Ịna ekwu okwu ndị n'eme ka agbụ gbazee ka mmanụ. Ọ dị mkpa ka ikwugidesie ike n'eziokwu a.
Onyinye Chineke dị ná ndụ gị dị̀ ka ọkụ. Ekwela ka o menyuo. Fùnyé nnukwu ikuku ná ichekuọkụ gị wee fee ya òfúfé ka ọ ghọọ nnukwute ọkụ pụrụ irepịasí ihe niile! Ndị mmadụ chọrọ̀ ma ya adị ha mkpa ka ọkụ ahụ dị gị n'ime nwusie ike n'ime gị ma si na gị nwupùta, n'ihi na i bụ̀ nwa Ya, amụarịrị ọzọ n'ụdịdị Ya.
Chineke n'agwa gị okwu dị ka i gà abụ́, abụghị na ka i dị. O nwerè nnukwu okwukwe n'ime atụmatụ Ya maka ndụ gị. N'ìhè nke a, kedụ ụfọdụ ihe ọ dị mkpa ka ịkwụsị (ma ọ bụ malite) ikwu n'isi gị?
Ọ bụrụ na ịgụ atụmatụ ihe ọgụgụ a tọrọ gị ụtọ, ana m agba gị ume ka igakwuo ime site n'ịlele akwụkwọ m ọhụrụ Isigbúonwegị n'ike: Ịchọta Eziokwu N'ime Ụwa Kwa Ụwa Nke Echiche.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Gịnị bụ̀ eziokwu? Ka omenala si dị nà-anakwere ụgha bụ na eziokwu dị ka osimiri, nke n'erùjú ma n'ata ka oge n'aga. Mana eziokwu abụghị osimiri—ọ bụ nkume. Ma n'ime osimiri nke echiche gasị dị iche iche, atụmatụ ihe ọgụgụ a gà-enye aka jigidesie mkpụrụ obi gị ike—n'enye gị ụzọ doro anya isi jee ije n'ime ụwa n'eme nchigharí na nkwagharí.
More