Isi Ike, Nke Si N'aka Lisa BevereIhe Nhụchatụ

Mgbe anyị natarà ịhụnanya Chineke, nzaghachi n'apụta ma kwesị ekwesị bụ ka anyị n'enye ịhụnanya. Anyị kwesịrị ịhụ n'anya n'ụzọ egwù adịghị, nke dị ike, na nke n'adịghị agwụ agwụ. Ihe mgbaàmà bụ ezie nke onye ma na ahụrụ ya n'anya bụ na ọ n'ahụ n'anya n'ụzọ dị mma.
Chineke enweghị ịhụnanya; Ọ bụ̀ ịhụnanya. Ịhụ n'anya bụ ka Ọ dị. Ma n'ihi na Ọ bụ̀ ịhụnanya, ị pụghị ịkwụsị Ya ịhụ gị n'anya. Ịhụnanya dị́ ike karịa ihe niile na sie ike ebighị ebi, nke ila elu gị na ịda ala gị apụghị ịkwa aka.
Mana n'ihi na Chineke hụrụ onye niile n'anya, Ọ pụghị ihu ihe niile n'anya. Ebe ọ bụ na Chineke adịghị ada mbà n'ịhụnanya Ya, O kwesịkwarà isigide ike n'ihe Ọ kpọrọ asị.
Ihe a nwerè ike iyi ka ihe n'enye nsogbu n'uche na elee ya anya na mbụ, mana ọ bụ n'ihi na ka anyị si eme ihe n'obibi ndụ anyị ewèrelá ịhụnanya mee ya ka chi. Anyị mà na Chineke Bụ̀ ịhụnanya, mana ànyị èmeelá ka anyị si akọwa ịhụnanya ka ọ ghọọ chi?
Eziokwu dịnụ bụ̀, Chineke kpọrọ ihe ọbụla n'eme ka ịhụnanya laa, asị. Ọ kpọrọ ihe ọbụla n'etibìsí ndị Ọ hụrụ n'anya, asị. Ọ bụ ya kpatarà na Chineke gà-akpọrirí asị ihe ọbụla na-agbagọ̀ ụdị mmadụ anyị bụ̀ n'ezie.
Akwụkwọ Nsọ nà-agwakwa anyị na Chineke kpọrọ asị: ihe niile n'emebi ikpe ziri ezi na eziokwu, mmegbu nke ụmụ nwaanyị isi mkpe na ndị n'enweghị nne na nna, mmegbu ndị kara nka na elekọtaghị ndị ezinụlọ, ihe n'agbagọ̀ ịdị mma Ya na metọọ onyinye Ya gasị, mgbagọ̀ ịhụnanya ka ọ ghọọ nlekọta naanị nke onwe-onye na ndị enyi ịghọ ndị iro, ihe n'agbanwe oyiyi Ya ma gbagọọ nke anyị, ịkpọ ihe ọjọọ ihe ọma na igbu ndị aka ha dị ọcha, anyị ikwe ka mpako na ngàngà wụọ anyị n'ala. Na nkenke, Chineke kpọrọ asị ihe ọ bụla n'emetọ ịhụnanya, n'ihi na ihe ọbụla n'emetọ ịhụnanya n'emetọ anyị.
Anyị apụghị inwe ịhụnanya bụ ezi ya ma ọ bụrụ na anyị “hụrụ ihe niile n'anya.” Chineke dị nsigide-ike n'ịhụnanya ma n'ịkpọ asị, ya merè na anyị gà-amụtarirí ịhụ n'anya ihe Chineke hụrụ n'anya ma kpọọ asị ihe Ọ kpọrọ asị.
Kedụ ụfọdụ ụzọ ndụ anyị n'ebi n'oge ugbu a si wee mee echiche nke ya gbasara ịhụnanya chi? Chineke hụrụ onye niile n'anya, mana ọ hụghị ihe niile n'anya. Kedụ ka eziokwu a si dị kà, n'ime ndụ gị?
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Gịnị bụ̀ eziokwu? Ka omenala si dị nà-anakwere ụgha bụ na eziokwu dị ka osimiri, nke n'erùjú ma n'ata ka oge n'aga. Mana eziokwu abụghị osimiri—ọ bụ nkume. Ma n'ime osimiri nke echiche gasị dị iche iche, atụmatụ ihe ọgụgụ a gà-enye aka jigidesie mkpụrụ obi gị ike—n'enye gị ụzọ doro anya isi jee ije n'ime ụwa n'eme nchigharí na nkwagharí.
More