Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Isi Ike, Nke Si N'aka Lisa BevereIhe Nhụchatụ

Adamant With Lisa Bevere

ỤBỌCHỊ 4 NKE 6

Ị̀ chọrọ̀ ka amará gị nke ọma . . . ma ọ bụ̀ ị chọrọ̀ ka mmetụta gị ná ndụ ná uche ndị mmadụ bawanye?

Ịma mmadụ na mmetụta ya ibawanye dị ka hà yirì onwe ha, mana ha dị ezigbo iche. Ịbụ́ onye ama ama bụ̀ na ịga n'esoghari ndị mmadụ ma ọ bụ na-agwa ha ihe ndị ha chọrọ ịnụ. Mana ụba mmetụta n'akpọ gị òkù ka ị kwupụtá n'eziokwu.

N'ime ime ya, eziokwu abụghị ihe, kama ọ bụ onye, n'ihi na Jizọs si na Ya bụ eziokwu. Jizọs kwukwarà na Okwu Chineke Bụ̀ eziokwu. Ọ n'atọ ndụ ụwa ụtọ ichè na eziokwu bụ ihe n'achigharí ka mmiri ma daberé n'ọnọdụ ana ekwu maka ya mana eziokwu gbadoró ụkwụ n'ime onye Jizọs bụ̀ na Okwu Chineke enwekataghị gbanwee. N'ime ụwa jupụtarà na echiche kwa echiche, Okwu Chineke n'eduga anyị na nkwenye gasị anyị pụrụ ịwụ ndụ anyị n'elu ha.

Anyị gà adị mkpachara anya ịma ọdịiche dị n'etiti echiche na nkwenye gasị. Ụwa anyị achọghị unyi na nsogbu n'esite na ọtụtụ echiche. Ihe dị ya mkpa bụ nkwugidesi ike n'eso eziokwu abịa. Ka anyị ghara itinye aka ná mkpọtụ na-ewepụ uche anyị ma n'eme ka anyị ghara ile anya n'Okwu Chineke na ilekwasị Mmụọ nke eziokwu anya.

Echiche gasị dị mfe ime na ịgbanwè, mana sie ike ihichapụ ma ọ bụrụ na anyị akpachaghị anya wee n'efekasí nke anyị ebe niile. Ha n'aghọ unyi jụrụ ebe niile n'emetọsi ndụ ndị ọzọ na ndụ anyị. Anyị kwesịrị iji nkpachara-anya jikwaa okwu ndị si n'ọnụ anyị apụta iji hụ na anyị sò bụrụ akụkụ nke ngwọta nye nsogbu gasị e terè anyị mmanụ ịgbanwè.

Ana m ama gị aka ka ị hazie ndụ gị ma jikwaa okwu ndị si n'ọnụ gị apụta. Kpachara anya ihe ndị ịna agụ, ịna ege, ịna ekwu, ma ọ bụ ịna etinye n'ebe mgbasa-ozi-ọha gị. Eburulá nsogbu ezinụlọ gị, ma ọ bụ nke ụlọ ụka gị, tọgbọrọ ndị ụwa kà ha n'ekiri ma n'ege. Mana, n'otu aka ahụ, agbachilá nkịtị maka ha: Kwuoro ndị ezinụlọ gị okwu maka nsogbu ezinụlọ. Ọ bụrụ na mmadụ esoghị n'esemokwu n'emenụ ma ọ bụ ọ pụghị iwètè ngwọta nye ihe n'aganụ, adọkpụrụlá ha tinye n'okwu n'aga. N'ihi na ime otù ahụ n'eme ka okwu ma ọ bụ nsogbu n'aga rikwuo elu kama iwètè ngwọta nye ya.

Kedụ ka ịgbachi nkịtị gbasara ihe ndị dị mkpa si bụrụ otu ihe dịka ịkwado ha? Gịnị ka ikwu okwu n'ụzọ gị isò bụrụ akụkụ n'enye ngwọta kama isò bụrụ akụkụ n'akpali esemokwu, pụtarà?

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Adamant With Lisa Bevere

Gịnị bụ̀ eziokwu? Ka omenala si dị nà-anakwere ụgha bụ na eziokwu dị ka osimiri, nke n'erùjú ma n'ata ka oge n'aga. Mana eziokwu abụghị osimiri—ọ bụ nkume. Ma n'ime osimiri nke echiche gasị dị iche iche, atụmatụ ihe ọgụgụ a gà-enye aka jigidesie mkpụrụ obi gị ike—n'enye gị ụzọ doro anya isi jee ije n'ime ụwa n'eme nchigharí na nkwagharí.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele John & Lisa Bevere maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://iamadamant.com