Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Isi Ike, Nke Si N'aka Lisa BevereIhe Nhụchatụ

Adamant With Lisa Bevere

ỤBỌCHỊ 1 NKE 6

Ọtụtụ narị afọ gara aga ndị mmadụ chọsirì ike ihe ana akpọ adamas. Okwute a ana amaghị ama gà-emecha dị ike, n'adọ oké ọ̀dị́dọ́, n'achake zìì, ma apụghị ibibi ya ma ọlị. Ndị na-achị cherè na ọbụrụ na ha nwerè ike ịchọta ya, ha nwerè ike iji ya wee kpụọ uwe agha ha na ngwá agha ha ka ha dịgide ike ruo ebighị ebi. Narị afọ kwa narị afọ, ndị obi ike garà njem ọchịchọ gasị, na-achọ okwute a dị anwansi.

Ụdị ihe a nà-amasị m. O nwerè ihe na-adoro uche na akpịrị gbasara ime njem ọchịchọ gasị na okwute gasị n'enye nnukwu ike, mana ọ dịghị onye n'eme njem ọchịchọ maka okwute dị anwansi, ọzọ. Ugbu a ọchịchọ ahụ agbanweela. Ọ bụghịzi okwute n'adịghị emebi emebi ka ndị ụwa n'achọ; ha nà-achọ eziokwu n'adịghị emebi emebi na nke n'adịghị agbanwe agbanwe.

N'ime ime anyị, anyị chọrọ ihe siri ike, ihe n'adịghị agbanwe agbanwe. Ọbụna Pontius Paịlet jụrụ Jizọs, “Gịnị bụ̀ eziokwu?” Nye ọtụtụ ndị, nke a bụ ajụjụ siri ike—ma ọtụtụ oge agaala, anyị akà zabeghị ma ọ bụ dị njikere iza ya.

Anyị bi n'ụbọchị nke mkparịta-ụka dị omimi, mmekọrịta dị omimi, na njikọ dị omimi anyị na Okwu Chineke, bụ́ eziokwu, dị anyị mkpa. Anyị bi n'ọgbọ anapụworò anyị egwù ịtụnanya anyị, ma ọtụtụ mgbe ihe ana ahapụrụ anyị bụ nchụso anyị ndị na-abaghị uru, anyị abụrụ ndị ana atụgharị ka azụ n'ime osimiri nke ihe anyị nà-akpọ eziokwu.

Mana eziokwu abụghị osimiri. Ọ bụ̀ nkume.

N'etiti mgbagwoju anya na ntụnyere n'abaghị uru, ọ dị oké mkpa ka anyị tụgharịa chee ihu n'ebe Jizọs nọ. Ọ bụ̀ Ya bụ̀ Oké Nkume anyị, Adamant anyị: ápụghị ịkwa aka, ápụghị ịtụgharị. Ana akpọ anyị òkù ka anyị tụọ ndụ anyị n'ime Ya—abụghị naanị n'elu Ya, kama n'ime Ya—dịka mgbọrọgwụ anyị siri ike. Ọ bụ̀ Ya bụ̀ ihe nzọgide-ụkwụ siri ike n'ime ụwa ntú na ihe mgbapịa ụkwụ jurù.

Mgbe anyị merè nke a, Ọ n'eme ka anyị kwuru chịm, dịka Ya. Ọ bụ̀ Ya bụ̀ isi-nkume-nke-ụlọ-anyị, mana anyị bụkwa okwute gasị dị ndụ, eji anyị na Ya wuo kà ụlọ ime mmụọ n'arụ ọrụ ka ebe nduzi, na nlekọta na mgbabà nye ndị niile ụwa anyị n'émé ntụgharị oge niile n'ènyé nsogbu.

Nke a sò bụrụ akụkụ nke ọkpụkpọ-òkù anyị dịka Ndị Kraịst—ikwugidesi ike n'eziokwu, abụghị naanị maka anyị, kama maka ihi ndị n'achọ ihe ha gà-ewukwasí ndụ ha n'elu ya.

Kedụ ihe ọ pụtara nye gị na Jizọs bụ̀ Oké Nkume Ahụ? Kedụ akụkụ gasị nke ụwa gị ebe eziokwu nà-achigharí ka mmiri?

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Adamant With Lisa Bevere

Gịnị bụ̀ eziokwu? Ka omenala si dị nà-anakwere ụgha bụ na eziokwu dị ka osimiri, nke n'erùjú ma n'ata ka oge n'aga. Mana eziokwu abụghị osimiri—ọ bụ nkume. Ma n'ime osimiri nke echiche gasị dị iche iche, atụmatụ ihe ọgụgụ a gà-enye aka jigidesie mkpụrụ obi gị ike—n'enye gị ụzọ doro anya isi jee ije n'ime ụwa n'eme nchigharí na nkwagharí.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele John & Lisa Bevere maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://iamadamant.com