Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Isi Ike, Nke Si N'aka Lisa BevereIhe Nhụchatụ

Adamant With Lisa Bevere

ỤBỌCHỊ 5 NKE 6

Ndị ụka na adịkarị njikere ikwutọ ndị n'ekweghị na Chineke maka njọ ha na kà ha si akpa àgwà, kama nke a ò kwesịghị ịbụ ihe n'eju anya na ndị n'amaghị Chineke n'akpa àgwà ka ha amaghị Chineke. Ihe anyị kwesịrị ilebà anya bụ̀ na, nke mbụ na nke kachasị mkpa, mà ànyị n'ebi ndụ dị nsọ na ndụ gbanwerè agbanwe. Ka anyị na-achụso Chineke, anyị pụrụ mgbe ahụ ịrịọ Ya maka amamihe ijirí kpughee obiọma Ya nye ụwa gbara anyị gburugburu n'ụzọ ga-adọta ha ka ha bịa chọta mgbanwe nke ha n'ime Ya.

Dị ka ụmụ Chineke, e kegharirì anyị ka anyị sigbuo onwe anyị ike dịka dayamond ma dịkwa nrọ̀ ka nwa ifùrù mara mma.

Anyị bì n'ụwa n'emejupụtá ihe Pọl derè na Ndị Rom 1. Ya merè na ọtụtụ n'ime anyị agbahapụlá ọmụma na ọnịnọ Chineke ma dizie nzuzu nke na ha apụghịzì ịmata ụkpụrụ gasị nke atụmatụ Ya maka ihe akpọrọ mmadụ.

Mana jụọ onwe gị, ikwugide ihe ọjọọ n'eme n'ụbọchị anyị ọ gbanweela ihe ọbụla? N'ụzọ dị mwute, ama anyị ama n'ihi ihe ndị anyị guzogiderè karịa ihe ndị anyị n'akwado. Ịdị nsọ na mgbanwe anyị nà-achọsi ike n'ime kà ọgbọ anyị si ebi ndụ agaghị abịa site na anyị ikwutọ na ịma ha ikpe, kama site na anyị ịbụ ụzọ lebà anya ná nsogbu ndị anyị nyàchà ka akpa ma nye obiọma, ebere, na olileanya Chineke n'aka na obi ndị chọrọ ya.

Chineke igosi anyị obiọma nà-abụkarị ọkpụkpọ-òkù ka anyị laghachi na eziokwu, ọ bụghị ịkwado omume mmehie n'aga n'ihu. Ọ bụ ya kpatarà inwe amamihe ji dị anyị mkpa. Ụfọdụ oge, anyị n'akpa àgwà ka ọ bụ̀ àgwà ọma na ngosipụta obi ọma isi na mmehie abụghị mmehie n'ihi na anyị achọghị ka ihere mee ndị mmadụ. Otu ọ sila dị, ọ dị mkpa ka anyị dị njikere ịkpọ mmehie ihe ọ bụ̀, mana mee ya n'ụzọ n'enye olileanya kama ikpe ọmụma.

Ịdị nsọ na ka anyị si ebi ndụ ugbu a n'amalite site na anyị ịnyefè Chineke onwe anyị niile. E nwerè ọgbọ agụụ mgbanwe n'agụ́si ike, ma ha n'echere ịhụ ya n'ime anyị.

Chineke n'ekwu na Ya gà-agwọ obodo mgbe ndị Ya wetùrù onwe ha ala ma kpee ekpere, abụghị mgbe ihe niile n'aga nke ọma na ọchịchị obodo ahụ. Gịnị ka nke a pụtarà nye gị?

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Adamant With Lisa Bevere

Gịnị bụ̀ eziokwu? Ka omenala si dị nà-anakwere ụgha bụ na eziokwu dị ka osimiri, nke n'erùjú ma n'ata ka oge n'aga. Mana eziokwu abụghị osimiri—ọ bụ nkume. Ma n'ime osimiri nke echiche gasị dị iche iche, atụmatụ ihe ọgụgụ a gà-enye aka jigidesie mkpụrụ obi gị ike—n'enye gị ụzọ doro anya isi jee ije n'ime ụwa n'eme nchigharí na nkwagharí.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele John & Lisa Bevere maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://iamadamant.com