Isi Ike, Nke Si N'aka Lisa BevereIhe Nhụchatụ

Ọ dịghị onye na-etolite ma ọchịchịrị adịghị akpa ya aka. Anyị nà-anụ olu gasị gburugburu anyị na-agwa anyị okwu, n'ekpe anyị ikpe, na-akpọ anyị aha n'adịghị mma. Ọtụtụ, ọbụrụ na ọ bụghị anyị niile, enyewokwá onwe anyị aha ndị n'adịghị mma—ihe ụgha ihe ndị anyị n'abụghị nke anyị pụrụ idụ́ isi na anyị bụ̀ ha n'ezie.
Mgbe Chineke nà-abịarute anyị nso, ọ bụghị ịma anyị ikpe, kama ọ bụ iji ịhụnanya chiri-anya kpọkọtá anyị na Ya ka anyị wee nwee ike ịnụ olu Ya n'ekwupụtá eziokwu nke ndị anyị bụ̀ n'ezie.
Eziokwu dịnụ bụ̀: Anyị abụghị ọchịchịrị nke ndụ anyị gara aga. Ma mmejọ anyị gasị, ndabara okike anyị, ma ọ bụ ihe ezi ọzọ adịghị akọwapụta ndị anyị bụ̀. Kama, anyị bụ̀ mmụọ gasị e kerè n'oyiyi Chineke, emerè ka anyị na Onye nyere anyị ume nọrọ ná mmekọrịta-chiri-anya.
Anyị n'efunahụ́ ndị anyị bụ̀ n'ezie mgbe anyị ji ihe ndị n'ezighi ezi akọwa onwe anyị. Ọ bụ ya kpatarà na Chineke gà ewepụcha aha na njirimara ndị ahụ n'ekedo ma n'egbochi anyị anyị tụtụrụlà ka anyị n'eme njem ndụ anyị. Mmụọ Ya n'arụ ọrụ n'ime ime anyị, n'ewepụgásí ihe ndị dị ochie ma n'ekpughe ihe ákà ahubeghị anya.
O nwerè ike bụrụ na ụjọ nà enweghị nchekwa emeela ka ịjụ ọrụ Chineke n'ime ndụ gị. Mana ụbọchị taa, Chineke n'ekwu okwu nye akụkụ gasị ndị ahụ ichè na ha tọgbọrọ chakoo, ma Ya ana enye onyinye nke ịgbanwe ha ka ha bụrụ ogige ihe ndụ n'ètó n'ime ya ọzọ.
Mana ọ dị mkpa ka anyị kwe ka Chineke kewapụ ìhè site n'ọchịchịrị dị n'ime ndụ anyị. Chineke agaghị ekwe ka ụgha ndị ahụ ekwurù n'isi gị ká dị́. Ọ gaghị ekwe ka ihe ndị ahụ ikwubirì n'isi gị bụrụ okwu ikpeazụ na njedebe nke ndụ gị. Kama, Ọ gà abịarute gị nso ka O wee jiri ịhụnanya chiri-anya kpughee ihe dị ọhụrụ n'ime gị, ihe ga-ewete ọgwụgwọ zuru okè nye akụkụ ọbụla ihe mgbu dị̀ n'ime ndụ gị, n'eme ka ịdị nnwere-onwe ibi ndụ n'ime eziokwu nke onye Ọ sí na ị bụ̀.
Ịhụnanya-chiri-anya nke Chineke adịghị asọ anya ịbịarute gị nso na ikpuchi gị. Ọ gà abịarute ihe mgbu gị ahụ ịna ezo ezo wee gwọọ gị ya, mana ịgà ekwe ka Ọ bata n'ime gị wee rụọ ọrụ a. Gịnị ka nke a pụrụ iyì kà n'ime ndụ gị?
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Gịnị bụ̀ eziokwu? Ka omenala si dị nà-anakwere ụgha bụ na eziokwu dị ka osimiri, nke n'erùjú ma n'ata ka oge n'aga. Mana eziokwu abụghị osimiri—ọ bụ nkume. Ma n'ime osimiri nke echiche gasị dị iche iche, atụmatụ ihe ọgụgụ a gà-enye aka jigidesie mkpụrụ obi gị ike—n'enye gị ụzọ doro anya isi jee ije n'ime ụwa n'eme nchigharí na nkwagharí.
More