Ihe Òfùfè-Gasị maka Lentị sitere na Holy Bible: MosiacIhe Nhụchatụ

John Calvin (France, 1509-1564)
Ibu ọnụ dị nsọ na nke iwu kwadoro nwere ebumnobi atọ ejiri mara ya. Anyị na-eji ya mee ka ike gwụ anụ ahụ anyị na mee ya ka ọ dị ala ka ọ ghara ikpa àgwà otu o si chọọ, ma ọ bụ ka anyị were ya dị njikere nke ọma maka ekpere na ntụgharị uche dị nsọ, ma ọ bụ ka ọ bụrụ ihe akaebe nke anyị ileda onwe anyị anya n'ihu Chineke, mgbe anyị chọrọ ikwupụta ikpe ọmụma anyị n'ihu Ya.

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ihe òfùfè a kwa ụbọchị gazụrụ ụbọchị iri anọ na isii nke Lentị, nke ewepụtara site na Holy Bible: Mosaic, na-achịkọta okwu gasị e kwuru, ihe ọgụgụ gasị, na Okwu Chineke, iji nyere gị aka tinye uche gị na Kraịst. Ma ị maghị ihe oge Lentị bụ màkà, ma ọ bụ na ị n'eme ememe Lentị ma n'eji kalenda nke afọ ụka eme ihe na ndụ gị niile, obi ga-atọ gị ụtọ maka ihe ọgụgụ gasị esi na Akwụkwọ Nsọ wepụtachaa na nghọta-ime nke òfùfè anatara n'aka Ndị Kraịst si ụwa gburugburu na sitekwa na nke ndị dịnụ n'oge gara aga. Soro anyị na Ndị Ụka nọ ụwa gburugburu n'ilekwasị anya na Jizọs n'izu nile nke n'eduga na Ista.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Ndị Mbipụta Ụlọ Tyndale maka mmesapụ aka ha n'inye Ihe Òfùfè Gasị maka Lentị sitere na Akwụkwọ Nsọ: Mosaic. Iji mụtakwuo banyere Akwụkwọ Nsọ: Mosaic, biko gaa na: www.tyndale.com/p/holy-bible-mosaic-nlt/9781414322056