Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ihe Òfùfè-Gasị maka Lentị sitere na Holy Bible: MosiacIhe Nhụchatụ

Devotions for Lent from Holy Bible: Mosaic

ỤBỌCHỊ 36 NKE 46

Iji Mkpachara-Anya Ebu Ọnụ (Clyde Taber)

Ibu ọnụ bụ okwu dị aṅaa na ntị anyị. Anyị achọghị ịna anụ maka ya, n'enwe obi abụọ banyere ya, ma n'ewere ya dịka ihe na abaghị uru. Anyị n'eme anya na obi dịka anyị amaghị ihe ọ bụ, otu ndị isi okpukperechi siri gafee nwoke ahụ e tiri ezigbo ihe n'ilu Jizọs kọrọ. Ma, nke bụ eziokwu bụ na ibu ọnụ so bụrụ akụkụ nke bụ isi n'ihe dum ndị Nzukọ-nsọ ​​mbụ mere.

Jizọs Kraịst kwadoro ma nabata omume ọgbụgba-ndụ ochie nke ibu ọnụ. “Mgbe ị na-enye onye nọ ná mkpa ihe” (Matiu 6:2), “mgbe ị na-ekpe ekpere” (Matiu 6:5), “mgbe ị na-ebu ọnụ” (Matiu 6:16) ka Ọ kụziri n’elu ugwu. Jizọs werela ya na inye ihe, ikpe ekpere, na ibu ọnụ so bụrụ ihe ndị a na-emekarị gbasara ibi ndụ ime mmụọ. Ha abụghị ihe ndị a ga-eme dịka ihe nhọrọ, kama ha so bụrụ akụkụ nke nkuzi dị isi n’ụlọ akwụkwọ nke Kraịst.

E burù ọnụ tupu ihe ọbụla dị egwu emee n'akụkọ gbasara ụmụ mmadụ. Mgbe Mozis buchara ọnụ, ọ natara mbadamba nkume abụọ ahụ gbanwere ihe ọmụma anyị banyere mmehie na echiche ụwa banyere ihe ziri ezi (Ọpụpụ 34:28). Mgbe Jizọs buchara ọnụ ka iko mmanya nke ọgbụgba-ndụ-ọhụrụ malitere ịgbá (Matiu 4:2). Mgbe ndị ndú Nzukọ-nsọ ​​nke mbụ buchara ọnụ ka ozi ọma nke Jizọs gbawapurù gafee oke ala Palestine (Ọrụ Ndị Ozi 13:2). Ụmụ Chineke ndị bi na Eshia n'oge senchurị iri abụọ buru ọnụ, ugbu a anyị n'ahụ ka ọnụọgụgụ ụlọ ụka na ndị n'ekwenye na Kraịst si n'eto n'ike n'ike n'ebe ahụ. Ọ na-amasị Nna-Anyị bi n'eluigwe nke ukwuu ịkwụ ndị ji obi ocha na-ebu ọnụ, ụgwọ ọrụ mara mma (Matiu 6:18).

Ibu ọnụ dị adị tupu ekwuwe maka ebumnobi, ya mere anyị kwesịrị ikpebi ihe anyị chọrọ irupụta site n'ibu ọnụ tupu anyị ebuwe yabụ ọnụ. Mgbe anyị na-ebu ọnụ, anyị kwesịrị iwere ya dị ka oge 'anyị na-edebe ma ọ bụ hapụ ihe' ka anyị 'welite ihe ọzọ, ihe ka mma." Anyị n'ahapụ iri nri ruo nwa oge ka anyị lekwasị anya nke ọma na Kraịst na alaeze Ya. Ọ dị mkpa ka anyị nwee mkpebi siri ike n'obi anyị na nnọgidesi ike tupu anyị ebido buwe ọnụ. Anyị n'eji oge ibu ọnụ wezụga onwe anyị na mkpọtụ nke ndụ. Ibu ọnụ na-akacha baara anyị uru mgbe anyị ji ọchịchọ, ịchụàjà na ịgha mkpụrụ nke ime mmụọ sonyere ya, karịa ịchụso ihe nke anụ ahụ. Mgbe anyị na-eri nri, ọ bụ anụ ahụ anyị ka anyị na-agba ume. Mgbe anyị na-ebu ọnụ, anyị na-agafe ókè nke anụ ahụ wee banye na mpaghara nke Mmụọ Nsọ.

Imị mkpụrụ n'ibu ọnụ abụghị nke n'eme ngwa-ngwa. Ị ga-ahụ mkpụrụ ma ị tinye oge na ya ma jiri ihe ndị ị mụtara site n'ime ya kwa-mgbe kwa-mgbe wulite ya. Mgbe ọbụla anyị na-abanye n'oge ibu ọnụ, Onye-nwe-anyị na-ezitere anyị amara Ya ịkwado anyị. Na mmalite, ibu ọnụ na-echetara anyị maka ọnwụ, ma ka anyị na-aga n'ihu n'eme ya, Mmụọ Nsọ na-atụgharị erighị nri anyị ka ọ ghọọ ndụ, ìhè na nghọta nke ime mmụọ nye anyị.

Ka Jizọs Kraịst si wee nwee obi siri ike banyere mkpebi Ya ịga Jeruselem, ka anyị were ụdị obi ahụ meso ibu ọnụ. Ọ gaghịzi abụ "ọ bụrụ na ị n'ebu ọnụ," kama ya ghọọ "mgbe ị na-ebu ọnụ."

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Devotions for Lent from Holy Bible: Mosaic

Ihe òfùfè a kwa ụbọchị gazụrụ ụbọchị iri anọ na isii nke Lentị, nke ewepụtara site na Holy Bible: Mosaic, na-achịkọta okwu gasị e kwuru, ihe ọgụgụ gasị, na Okwu Chineke, iji nyere gị aka tinye uche gị na Kraịst. Ma ị maghị ihe oge Lentị bụ màkà, ma ọ bụ na ị n'eme ememe Lentị ma n'eji kalenda nke afọ ụka eme ihe na ndụ gị niile, obi ga-atọ gị ụtọ maka ihe ọgụgụ gasị esi na Akwụkwọ Nsọ wepụtachaa na nghọta-ime nke òfùfè anatara n'aka Ndị Kraịst si ụwa gburugburu na sitekwa na nke ndị dịnụ n'oge gara aga. Soro anyị na Ndị Ụka nọ ụwa gburugburu n'ilekwasị anya na Jizọs n'izu nile nke n'eduga na Ista.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Ndị Mbipụta Ụlọ Tyndale maka mmesapụ aka ha n'inye Ihe Òfùfè Gasị maka Lentị sitere na Akwụkwọ Nsọ: Mosaic. Iji mụtakwuo banyere Akwụkwọ Nsọ: Mosaic, biko gaa na: www.tyndale.com/p/holy-bible-mosaic-nlt/9781414322056

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara