Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ihe Òfùfè-Gasị maka Lentị sitere na Holy Bible: MosiacIhe Nhụchatụ

Devotions for Lent from Holy Bible: Mosaic

ỤBỌCHỊ 42 NKE 46

Watchman Nee (China, 1903-1972)

Chineke ga-eme ka anyị bịaruo n'ebé - a pụghị m ịgwa gị otu ọ ga-esi wee mee, mana Ọ ga-eme ya - ebé, site na ahụmahụ dị omimi na nke gbara ọchịchịrị, a n'emetụ ike nke anụ ahụ anyị aka, ya wee nyuo dịka ihe a wụrụ mmiri oyi, nke ga-eme ka anyị ghara inwa anwa tụkwasị onwe anyị obi ọzọ. Chineke emesowo ụfọdụ n'ime anyi ihe n'ụzọ siri ike, ma buru anyị gaa njem site n'ụzọ siri ike na nke dị ụfụ, iji wee mee ka anyị ruo ebe ahụ... Mana ihe a niile bụ ka O wee nwee ike iji anyị wee mee ihe ka e mesịrị.

Anyị ga-achọ ka e jikọta ọnwụ na mbilite n'ọnwụ n'ime otu awa nke ibe ya. Ọ bụghị ihe n'ekwe anyị ichè n'echiche na Chineke ga-edebe anyị n'otu akụkụ ruo ogologo oge; ime nchere adịghị atọ anyị ụtọ. A pụghịkwanụ m ịgwa gị ogologo oge ọ ga-ewe, mana dị ka o si adị ka m kwuo ya otu a, na a ga-enwe oge doro anya mgbe Ọ ga-edobe gị ebe ahụ... Ihe niile ga-adị gị ka ịnọ n'ọchịchịrị, mana ahụmahụ a ga-abụ n'otu abalị. Ọ ga-abụrịrị otu abalị zuru oke, sọọsọ. Ka e mesịrị i ga-ahụ na enyeghachiri gị ihe nile ná mbilite n’ọnwụ dị ebube; ọ dịghịkwanu ihe pụrụ ịtụ ọdịiche dị n'etiti ihe dịbu na nke dị ugbu a!

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Devotions for Lent from Holy Bible: Mosaic

Ihe òfùfè a kwa ụbọchị gazụrụ ụbọchị iri anọ na isii nke Lentị, nke ewepụtara site na Holy Bible: Mosaic, na-achịkọta okwu gasị e kwuru, ihe ọgụgụ gasị, na Okwu Chineke, iji nyere gị aka tinye uche gị na Kraịst. Ma ị maghị ihe oge Lentị bụ màkà, ma ọ bụ na ị n'eme ememe Lentị ma n'eji kalenda nke afọ ụka eme ihe na ndụ gị niile, obi ga-atọ gị ụtọ maka ihe ọgụgụ gasị esi na Akwụkwọ Nsọ wepụtachaa na nghọta-ime nke òfùfè anatara n'aka Ndị Kraịst si ụwa gburugburu na sitekwa na nke ndị dịnụ n'oge gara aga. Soro anyị na Ndị Ụka nọ ụwa gburugburu n'ilekwasị anya na Jizọs n'izu nile nke n'eduga na Ista.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Ndị Mbipụta Ụlọ Tyndale maka mmesapụ aka ha n'inye Ihe Òfùfè Gasị maka Lentị sitere na Akwụkwọ Nsọ: Mosaic. Iji mụtakwuo banyere Akwụkwọ Nsọ: Mosaic, biko gaa na: www.tyndale.com/p/holy-bible-mosaic-nlt/9781414322056

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara