Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ihe Òfùfè-Gasị maka Lentị sitere na Holy Bible: MosiacIhe Nhụchatụ

Devotions for Lent from Holy Bible: Mosaic

ỤBỌCHỊ 41 NKE 46

Olileanya

Olileanya na-adị ka ihe n'adịghị adaba ma ọlị ma e jikọọ ya na ndị dịka okwukwe, ịhụnanya na omume ọma ndị ọzọ ama ama. Olileanya bụ atụmanya, ọchịchọ ka ihe mezuo, mana naanị ihe ọ dịka ọ n'eme bụ ime ka anyị n'echegbu onwe anyị ugbu a. Anyị n'enwe olileanya ka ebumnobi anyị mezuo, ma na-echè ihe anyị ga-enwe olileanya na ya ozugbo ebumnobi anyị mezucharà. Ọ n'apụta ka ọ bụ ezigbo ihe ọjọọ ịgwa enyi gị na ị hụrụ ha n'anya, nwee okwukwe na ha, ma nwee olileanya n'ebe ha nọ, dị ka ha akaghị buru ezigbo enyi gị kachasịnu ị ga-achọ ka ha bụrụ.

Ma n'agbanyeghị nke a, Chineke na-emesi anyị obi ike ka anyị jiri ntụkwasị obi tinye olileanya anyị na Ya. Ọ bụ ezie na nke a pụrụ iyi ka ihe n'eduga ná ndakpọ olileanya, dị ka ihe na-emekarị olileanya anyị banyere ihe nke ụwa a, ngunye olileanya n'akụkụ ọchịchọ ndị ahụ mara mma dị ka okwukwe na ịhụnanya, na-echetara anyị na nkwa Chineke kwesịrị n'ezie anyị ịtụkwasị olileanya anyị miri emi na ya.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Devotions for Lent from Holy Bible: Mosaic

Ihe òfùfè a kwa ụbọchị gazụrụ ụbọchị iri anọ na isii nke Lentị, nke ewepụtara site na Holy Bible: Mosaic, na-achịkọta okwu gasị e kwuru, ihe ọgụgụ gasị, na Okwu Chineke, iji nyere gị aka tinye uche gị na Kraịst. Ma ị maghị ihe oge Lentị bụ màkà, ma ọ bụ na ị n'eme ememe Lentị ma n'eji kalenda nke afọ ụka eme ihe na ndụ gị niile, obi ga-atọ gị ụtọ maka ihe ọgụgụ gasị esi na Akwụkwọ Nsọ wepụtachaa na nghọta-ime nke òfùfè anatara n'aka Ndị Kraịst si ụwa gburugburu na sitekwa na nke ndị dịnụ n'oge gara aga. Soro anyị na Ndị Ụka nọ ụwa gburugburu n'ilekwasị anya na Jizọs n'izu nile nke n'eduga na Ista.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Ndị Mbipụta Ụlọ Tyndale maka mmesapụ aka ha n'inye Ihe Òfùfè Gasị maka Lentị sitere na Akwụkwọ Nsọ: Mosaic. Iji mụtakwuo banyere Akwụkwọ Nsọ: Mosaic, biko gaa na: www.tyndale.com/p/holy-bible-mosaic-nlt/9781414322056

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara