Ihe Òfùfè-Gasị maka Lentị sitere na Holy Bible: MosiacIhe Nhụchatụ

Gịnị bụ̀ Lent?
Nye ụfọdụ Ndị Kraịst, Lent abụwo akụkụ nke ndụ ime mmụọ ha mgbe nile, mana nye ndị ọzọ, ọ bụ ihe ana-amaghị ama. Lent bụ oge n'eduga na Ista, oge Ndị Kraịst jirila ntụgharị uche, nchegharị na ekpere kwadoo obi ha maka Ista n'akụkọ ihe mere eme. Lent na-amalite na Ashị Wenezde wee n'aga n'ihu ruo ụbọchị iri anọ, wepụ Sonde gasị, n'ejedebé na Gud Fraịdee na Satọdee Dị Nsọ. Ebe Sonde gasị bụ ụbọchị eji eme emume mbilite n’ọnwụ Jizọs kwa izu, anaghị agụ Sonde isii dị n’ime Lent dị ka akụkụ nke ụbọchị iri anọ ana eme Lent, nke n'elekwasị anya na nyocha ime mmụọ, nyocha onwe onye, na nchegharị. Ọtụtụ Ndị Kraịst na-ahọrọ ibu ọnụ n'oge nile nke Lent, mana ihe a n'elekwasị anya abụghị ịnapụ onwe anyị ihe kama ọ bụ na-itinyè onwe anyị n'ime Chineke na nzube Ya niile n'ụwa.
Lent bụ oge dị mkpa nke afọ ụka. Afọ ụka bụ ụzọ magburu onwe ya isi nyere anyị aka ilekwasị anya na Chineke site n'ụzọ anyị si ahazi oge anyị. Kama ịgbaso usoro nke kalenda ama ama nke ọma, nke eji usoro okike hazie, ahaziri kalenda ụka gburugburu Chineke na ọrụ Ya n'ụwa. Kalenda ụka n'eso oge isii dị ogologo iche iche: Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa, Ekeresimesi, Epifanị, Lent, Ista, na Pentikọst. Oge nke ọ bụla ndị a nwere nlekwasị anya dị iche iche: Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa na-elekwasị anya na atụmanya nke ọbịbịa Chineke n'ụwa, na ọbịbịa Ya n'ụdị mmadụ ma na nloghachi Kraịst dịka Eze Ikpe. Ekeresimesi na-elekwasị anya na ọmụmụ Kraịst. Epifanị lekwasịrị anya n'ìhè nke ọnụnọ Chineke n'enwú n'ime ụwa. Lent lekwasịrị anya na mmehie mmadụ na ngwọta dị mma nke Chineke nyere. Ista lekwasịrị anya na ndụ mbilite n'ọnwụ. Pentikọst lekwasịrị anya n’ọrụ nke Mmụọ Nsọ na-agá n’ihu n’ụwa. Usoro mmemme nke oge ndị a kwa afọ pụrụ inwe mmetụta siri ike na utó ime mmụọ nke onwe, na nke obodo.
Ọ bụrụ na ọgụgụ nke ihe òfùfè Lent a nyere gị obi ụtọ, lelee Holy Bible: Mosaic, Akwụkwọ Nsọ ebipụtara ebipụta nke gụnyere ihe niile ị ga-agụ n'ihe òfùfè a, gbakwunyere ihe eserese n'agba zuru okè na agụmagụ gasị maka izu ụka ọ bụla nke afọ ụka.

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ihe òfùfè a kwa ụbọchị gazụrụ ụbọchị iri anọ na isii nke Lentị, nke ewepụtara site na Holy Bible: Mosaic, na-achịkọta okwu gasị e kwuru, ihe ọgụgụ gasị, na Okwu Chineke, iji nyere gị aka tinye uche gị na Kraịst. Ma ị maghị ihe oge Lentị bụ màkà, ma ọ bụ na ị n'eme ememe Lentị ma n'eji kalenda nke afọ ụka eme ihe na ndụ gị niile, obi ga-atọ gị ụtọ maka ihe ọgụgụ gasị esi na Akwụkwọ Nsọ wepụtachaa na nghọta-ime nke òfùfè anatara n'aka Ndị Kraịst si ụwa gburugburu na sitekwa na nke ndị dịnụ n'oge gara aga. Soro anyị na Ndị Ụka nọ ụwa gburugburu n'ilekwasị anya na Jizọs n'izu nile nke n'eduga na Ista.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Ndị Mbipụta Ụlọ Tyndale maka mmesapụ aka ha n'inye Ihe Òfùfè Gasị maka Lentị sitere na Akwụkwọ Nsọ: Mosaic. Iji mụtakwuo banyere Akwụkwọ Nsọ: Mosaic, biko gaa na: www.tyndale.com/p/holy-bible-mosaic-nlt/9781414322056