Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ihe Òfùfè-Gasị maka Lentị sitere na Holy Bible: MosiacIhe Nhụchatụ

Devotions for Lent from Holy Bible: Mosaic

ỤBỌCHỊ 35 NKE 46

Didache (Nkụzi Nke Ndịozi Iri Na Abụọ, c. A.D. 90)

Ma ekwela ka ibu ọnụ unu dịka nke ndị ihu abụọ; n’ihi na ha n'ebu ọnụ n’ụbọchị nke abụọ na nke ise n’izu; ma buonụ ọnụ n’ụbọchị nke anọ na Ụbọchị Nkwadebe (Fraịdee). Ụnụ ekpekwala ekpere dịka ndị ihu abụọ; ma dịka Onye-nwe-anyị nyere iwu n’Oziọma Ya, kpeenụ ekpere otu a: Nna-anyị Nke bi n'elu-igwe, Ka edoo aha-Gị nsọ. Ka ala-eze-Gị bịa. Ka emee uche-Gị, dịka esi eme ya n'elu-igwe, ka ọ dịkwa otu a n'ụwa. Nye anyị ụbọchị taa nri anyị nke kwa ụbọchị(dị anyị oké mkpa), gbaghara anyị ụgwọ anyị jì dịka anyị si agbaghara ndị ji anyị ụgwọ. Ekwela ka anyị daba na ọnwụnwa, kama napụta anyị n'aka onye iro (ma-ọbu, ihe ọjọ); n'ihi na ike na ebube niile bụ nke Gị ruo mgbe ebighị ebi. Kpee ekpere a ugboro atọ n'ụbọchị.

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Devotions for Lent from Holy Bible: Mosaic

Ihe òfùfè a kwa ụbọchị gazụrụ ụbọchị iri anọ na isii nke Lentị, nke ewepụtara site na Holy Bible: Mosaic, na-achịkọta okwu gasị e kwuru, ihe ọgụgụ gasị, na Okwu Chineke, iji nyere gị aka tinye uche gị na Kraịst. Ma ị maghị ihe oge Lentị bụ màkà, ma ọ bụ na ị n'eme ememe Lentị ma n'eji kalenda nke afọ ụka eme ihe na ndụ gị niile, obi ga-atọ gị ụtọ maka ihe ọgụgụ gasị esi na Akwụkwọ Nsọ wepụtachaa na nghọta-ime nke òfùfè anatara n'aka Ndị Kraịst si ụwa gburugburu na sitekwa na nke ndị dịnụ n'oge gara aga. Soro anyị na Ndị Ụka nọ ụwa gburugburu n'ilekwasị anya na Jizọs n'izu nile nke n'eduga na Ista.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Ndị Mbipụta Ụlọ Tyndale maka mmesapụ aka ha n'inye Ihe Òfùfè Gasị maka Lentị sitere na Akwụkwọ Nsọ: Mosaic. Iji mụtakwuo banyere Akwụkwọ Nsọ: Mosaic, biko gaa na: www.tyndale.com/p/holy-bible-mosaic-nlt/9781414322056

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara