Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ihe Òfùfè-Gasị maka Lentị sitere na Holy Bible: MosiacIhe Nhụchatụ

Devotions for Lent from Holy Bible: Mosaic

ỤBỌCHỊ 34 NKE 46

Ibu Ọnụ

Nye ọtụtụ Ndị Kraịst, ọ bụ ihe a na-emekarị ịhapụ ihe ụtọ ma ọ bụ ihe eji atụ ndụ mmanụ gasị n'oge Lentị. Mgbe anyị na-ekpebi ihe anyị ga-ahapụ n'oge ibu ọnụ, anyị na-ahọrọkarị ihe anyị cherè na ọ bụ ya n'egbochi ụtọ na mmekọrịta anyị na Jizọs Kraịst. Ma ụdị ibu ọnụ kachasị dị ochie - ịghara iri nri ma ọ bụ ikpachapụ anya siri ike ka anyị si eri nri - abụghị ihe e mere iji wepụ ihe ndị gasị a n'ahụ dịka ihe ndị ụtọ nke mmehie na ndụ mmadụ.

O nwere ike ịbụ na ka anyị funahụrụ nkà nke ibu ọnụ, anyị efụnahukwala nghọta banyere ihe a pụrụ inweta site n'iwepụta onwe anyị ịhapụ ihe e chere na ọ dị mkpa. N'ime akụkọ ihe mere eme nke Akwụkwọ Nsọ na nke Ndị Kraịst, ọtụtụ ndị ebuwo ọnụ ruo oge ziri ezi na nke dị ahụike. N'ezie, atụmanya nke inwe afọ ojuju ozugbo-ozugbo na omenala anyị adịghị ahụ ihe ọbụla gbasara ibu ọnụ dịka ihe dị mma. Ma o nwere iké ịbụ́ na Chineke nwere ihe Ọ chọrọ ikpughere anyị n'ime nwa oge anyị n'ebu ọnụ?

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Devotions for Lent from Holy Bible: Mosaic

Ihe òfùfè a kwa ụbọchị gazụrụ ụbọchị iri anọ na isii nke Lentị, nke ewepụtara site na Holy Bible: Mosaic, na-achịkọta okwu gasị e kwuru, ihe ọgụgụ gasị, na Okwu Chineke, iji nyere gị aka tinye uche gị na Kraịst. Ma ị maghị ihe oge Lentị bụ màkà, ma ọ bụ na ị n'eme ememe Lentị ma n'eji kalenda nke afọ ụka eme ihe na ndụ gị niile, obi ga-atọ gị ụtọ maka ihe ọgụgụ gasị esi na Akwụkwọ Nsọ wepụtachaa na nghọta-ime nke òfùfè anatara n'aka Ndị Kraịst si ụwa gburugburu na sitekwa na nke ndị dịnụ n'oge gara aga. Soro anyị na Ndị Ụka nọ ụwa gburugburu n'ilekwasị anya na Jizọs n'izu nile nke n'eduga na Ista.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Ndị Mbipụta Ụlọ Tyndale maka mmesapụ aka ha n'inye Ihe Òfùfè Gasị maka Lentị sitere na Akwụkwọ Nsọ: Mosaic. Iji mụtakwuo banyere Akwụkwọ Nsọ: Mosaic, biko gaa na: www.tyndale.com/p/holy-bible-mosaic-nlt/9781414322056

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara