Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ihe Òfùfè-Gasị maka Lentị sitere na Holy Bible: MosiacIhe Nhụchatụ

Devotions for Lent from Holy Bible: Mosaic

ỤBỌCHỊ 30 NKE 46

Pandita Ramabai (India, 1858-1922)

Afọ ole na ole gara aga, e mere ka m ghọta na nkwenye m bụ naanị nkwenye nke ọgụgụ isi - nkwenye nke ndụ n'adịghị na ya. Nkwenye m ahụ bụ na m nọ na-ele anya inweta nzọpụta n'ọdịnihu mgbe m nwụchara; nke pụtara na mkpuru obi m “Esibeghị n'ọnwụ pụta banye na ndụ”. Chineke gosiri m otú ọnọdụ m si wee dị ezigbote ize ndụ, na ihe m bụ ajọ onye mmehie na onye furu efu, na otú ọ si diri m ezigbo mkpa inweta nzọpụta ugbu a, a bụghị n'oge dịnihu. Ncheghari m weerè nnukwu oge; Enweghị m ezumike ma fó ihe obere ka ahụ rịa m, ehighikwa m ụra ọtụtụ anyasị. Aka Mmụọ Nsọ dị oké ike n'ahụ m nke mere na ezumike gbara ọsọ n'ebe m nọ ruo mgbe m nabatara nzọpụta mgbe ahụ na n'oge ahụ. N’ihi ihe ndị a, ekpesiri m ekpere ike ka Chineke gbaghara m mmehie m n’ihi Jizọs Kraịst ma mee ka m ghọta na enwetawo m nzọpụta n’ezie site n’aka Ya. Ekweere m nkwa Chineke wee tinye obi m niile n’Okwu Ya, ma mgbe m meworo nke a, ibu arọ m si n'ahụ m dapụ, m wee chọpụta na a gbághàráwo m na napụta m n’ike nke mmehie.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Devotions for Lent from Holy Bible: Mosaic

Ihe òfùfè a kwa ụbọchị gazụrụ ụbọchị iri anọ na isii nke Lentị, nke ewepụtara site na Holy Bible: Mosaic, na-achịkọta okwu gasị e kwuru, ihe ọgụgụ gasị, na Okwu Chineke, iji nyere gị aka tinye uche gị na Kraịst. Ma ị maghị ihe oge Lentị bụ màkà, ma ọ bụ na ị n'eme ememe Lentị ma n'eji kalenda nke afọ ụka eme ihe na ndụ gị niile, obi ga-atọ gị ụtọ maka ihe ọgụgụ gasị esi na Akwụkwọ Nsọ wepụtachaa na nghọta-ime nke òfùfè anatara n'aka Ndị Kraịst si ụwa gburugburu na sitekwa na nke ndị dịnụ n'oge gara aga. Soro anyị na Ndị Ụka nọ ụwa gburugburu n'ilekwasị anya na Jizọs n'izu nile nke n'eduga na Ista.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Ndị Mbipụta Ụlọ Tyndale maka mmesapụ aka ha n'inye Ihe Òfùfè Gasị maka Lentị sitere na Akwụkwọ Nsọ: Mosaic. Iji mụtakwuo banyere Akwụkwọ Nsọ: Mosaic, biko gaa na: www.tyndale.com/p/holy-bible-mosaic-nlt/9781414322056

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara