Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ihe Òfùfè-Gasị maka Lentị sitere na Holy Bible: MosiacIhe Nhụchatụ

Devotions for Lent from Holy Bible: Mosaic

ỤBỌCHỊ 29 NKE 46

Ísì Nkè Mmehie (Timothy G. Walton)

Otu onye ozizi mbụ nke Amerịka si n’otu obodo gaa n’otu obodo n'ezi ozi ọma. A gbara ama na ka ọ na-erute n'ebe esi abanye obodo ndị ahu, ọ na-akwụsịtụ sị, Ana m esite ọkụ mmụọ! Ọ bụrụ na anyị nwere ike isite ísì ọkụ mmụọ, ụwa ọ̀ ga n'esi anyị ísì dị ka ọkụ mmụọ? Inwe ike na ịdị n'esite ísì ọkụ mmụọ bụ ihe ana-amaghị maka ya ma ọlị oge ugbu a. N'agbanyeghị nke ahụ, ísì a bụ nke n'ekpò n'ebe niile n'ụwa a n'ihi ihe ọjọọ sitere na mmehie Adam na Iv.

Gịnị bụ uche gị banyere mmehie? Ndị mmadụ nwere ụzọ sara mbara na nke dị iche iche ha si emeso mmehie omume. Ha na-agọnarị ya. Ha na-ebelata mmetụta ya. Ha n'eme ngọpụ-gasi maka ya. Ha na-asị na ọ bụ ndị ọzọ mere ha jiri mee mmehie. Duke, otu onye akọrọ akụkọ ya na akwụkwọ James Thurber, 'The Thirteen Clocks', na-ekweta si, "Anyị niile nwere obere adịghị ike anyị gasị; nke m bụ na abụ m ajọ mmadụ.”

Gịnị mere ime mmehie jiri dị njọ? Ònyé kwurù na mmehie bụ mmehie? Naanị ịkpọ mmehie, mmehie, gosipụtara ogo na ọkwá e debere. Ọ bụrụ na otu onye agha n'echekwa okporo ụzọ akwụsị gị maka iji oké ọsọ wee n'anya ụgbọala gị, ọ pụtara na o nwere ihe ngosi gọọmenti dịnụ nyeré iwu na ị kwesịghị ịnya ụgbọala otu ahụ, gị ewee daa yabụ iwu. Ọkwá omume kwesịrị ekwesị maka mmadụ niile si na ịdị nsọ nke àgwà Chineke pụta.

Ụwa a nke n'esi mmehie mmehie na-esikwa ísì ọnwụ. Akwụkwọ Nsọ kwuru na ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ. Mmehie na-eduba n'ọnwụ. Ọnwụ batara na Ogige Eden. Adam na Iv adaghị na ala wee nwụọ ozugbo ha tara mkpụrụ osisi ahụ e nyere ha iwu ka ha hara ita, ikwu eziokwu, mana ihe abụọ mere ozugbo: Mkpụrụ nke ọnwụ́ ahụrụ anya kụrụ n'ime ha. Mmadụ abụọ zuru okè e kere ka ha bụrụ ndị enwekataghị mee agadi malitere ịka nká ma mesịa nwụọ. Ha nwụkwara ọnwụ nke ime mmụọ. Mmekọrịta chirianya na ọbụbụenyi ha na Onye-nwe-anyị nwụrụ. Ihe ọzọ a hụrụ bụ na Jenesis 3 ebe Adam na Iv nọ n'ezo onwe ha n'etiti osisi na ahịhịa gasị ka Chineke hara ihu ha. Ọ bụ ezie na ha aghọtaghị ya n’oge ahụ, mana olileanya ha naanị bụ ka Chineke mee ihe dị oké egwú iji napụta ha ma mee ka ha na Ya dịghachi ná mmekọrịta zuru ezu. Mgbe Chineke chụrụ anụmanụ abụọ n’àjà wee kwusaa ọbịbịa nke Jizọs Kraịst, Onye-Nzọpụta (Jenesis 3:15), O mere nnọọ otu ahụ.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Devotions for Lent from Holy Bible: Mosaic

Ihe òfùfè a kwa ụbọchị gazụrụ ụbọchị iri anọ na isii nke Lentị, nke ewepụtara site na Holy Bible: Mosaic, na-achịkọta okwu gasị e kwuru, ihe ọgụgụ gasị, na Okwu Chineke, iji nyere gị aka tinye uche gị na Kraịst. Ma ị maghị ihe oge Lentị bụ màkà, ma ọ bụ na ị n'eme ememe Lentị ma n'eji kalenda nke afọ ụka eme ihe na ndụ gị niile, obi ga-atọ gị ụtọ maka ihe ọgụgụ gasị esi na Akwụkwọ Nsọ wepụtachaa na nghọta-ime nke òfùfè anatara n'aka Ndị Kraịst si ụwa gburugburu na sitekwa na nke ndị dịnụ n'oge gara aga. Soro anyị na Ndị Ụka nọ ụwa gburugburu n'ilekwasị anya na Jizọs n'izu nile nke n'eduga na Ista.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Ndị Mbipụta Ụlọ Tyndale maka mmesapụ aka ha n'inye Ihe Òfùfè Gasị maka Lentị sitere na Akwụkwọ Nsọ: Mosaic. Iji mụtakwuo banyere Akwụkwọ Nsọ: Mosaic, biko gaa na: www.tyndale.com/p/holy-bible-mosaic-nlt/9781414322056

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara