YouVersion Logo
Search Icon

MAIKA 1

1
1Okwu Jehova nke ruru Maika, bú onye Moreshet, nti, n'ubọchi Jotam na Ehaz na Hezekaia, bú ndi-eze Juda, bú okwu nke ọ huru bayere Sameria na Jerusalem.
2Nurunu, unu ndi nile di iche iche, unu nile; ṅa nti, gi uwa, na ùjú-ya: ka Onye-nwe-ayi Jehova ghọ onye-àmà n'etiti unu, bú Onye-nwe-ayi site n'ulo uku Ya di nsọ. 3N'ihi na, le, Jehova nēsi n'ebe-Ya puta, Ọ gāridata kwa, zọkwasi ebe di elu nile nke uwa ukwu. 4Ugwu nile gāb͕aze kwa n'okpuru Ya, agāb͕awa kwa ndagwurugwu nile, dika wax n'iru ọku, dika miri nke anāwuda n'ebe-nrida. 5N'ihi njehie Jekob ka ihe a nile di, na n'ihi nmehie nile nke ulo Israel. Gini bu njehie Jekob? ọ̀ bughi Sameria? gini bu kwa ebe di elu nile nke Juda? hà abughi Jerusalem? 6M'gēme kwa Sameria ka ọ ghọ obo-ihe nke ọhia, ka ọ ghọ kwa ebe akuru ubi-vine: M'gāwusi kwa nkume-ya nile nime ndagwurugwu, ọ bu kwa ntọ-ala-ya nile ka M'gēkpughe. 7Ọ bu kwa arusi-ya nile apiri api ka agētipia, ọ bu kwa onyinye ikwa-iko ya nile ka agēsure n'ọku, ọ bu kwa arusi-ya nile ka M'gēme ebe tọb͕ọrọ n'efu: n'ihi na o siworo n'onyinye nwanyi nke nākwa iko chikọta ha, ọ bu kwa rue onyinye nwanyi nākwa iko ka ha gālaghachi. 8N'ihi nka ka m'gēti aka n'obi, kwasie ákwá ike, jegharia buru onye yipuworo uwe b͕a ọtọ: m'gēme ikwa-ákwá dika nkita-ọhia, na iru-újú dika enyi-nnunu. 9N'ihi na ihe nādighi ngwọta ka ntiputa-ọnyá nile bu: n'ihi na ọ biaruwo Juda; o rutewo ọnu-uzọ-ama ndim, rue Jerusalem. 10Unu egosila ya na Gat, unu akwala ákwá ma-ọli: nime Bet-le-afra ka m'turuworo onwem n'ájá. 11Gabigara onwe-unu, gi nwanyi bi na Shafia, n'ọtọ na ihere: nwanyi bi na Zeanan aputaghi; otiti-aka-n'obi nke Bet-izel gānapu unu ebe-nguzo-ya. 12N'ihi na nwanyi bi na Marot echerewo inwe ezi ihe: n'ihi na ihe ọjọ esiwo n'ebe Jehova nọ ridarue ọnu-uzọ-ama Jerusalem. 13Kegide ub͕ọ-ala n'inyinya ukwu ọsọ, gi nwanyi bi na Lekish: isi-nmalite nmehie ka ọ buru ada Zaion; n'ihi na ọ bu nime gi ka ahuru njehie nile nke Israel. 14N'ihi nka ka i gēnye Moreshet-gat ihe-idu-ulo di iche iche: ulo nile nke Akzib gāghọrọ ndi-eze Israel miri-iyi nārafu arafu. 15Ọzọ, onye-nnweta ka M'gēme ka ọ biakute gi, gi nwanyi bi na Maresha: rue Adulam ka nsọpuru Israel gābia. 16Mere onwe-gi isi-nkwọcha, kọpu isi-gi n'ihi umu nke ihe-utọ-gi nile: me ka isi-nkwọcha-gi sa mbara dika nke udele; n'ihi na emewo ka ha si n'ebe i nọ je biri n'ala ọzọ.

Currently Selected:

MAIKA 1: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy