YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ-ÁKWÁ 1

1
1Le, ka obodo ahu nke ndi-ya di ọtutu si nọdu ala nání ya!
Le, ka o siworo ghọ ihe di ka nwanyi di-ya nwuru!
Obodo nke riri nne n'etiti mba nile, nke bu isi n'etiti ala nile anāchi achi,
Le, ka o siworo ghọ usu ndi nēfè òfùfè.
2Ọ nākwasi ákwá ike n'abali, anya-miri-ya di kwa na ǹtì-ya abua;
Ọ dighi onye-nkasi-obi o nwere n'etiti ndi nile nāhu ya n'anya:
Ndi-eyì-ya nile aghọb͕uwo ya,
Ha aghọworo ya ndi-iro.
3Juda ejewo ibiri n'ala ọzọ site na nweda-n'ala, na site n'iba-uba nke ọbubu-orù;
Ya onwe-ya ebiriwo n'etiti mba nile, ọ chọtaghi izu-ike:
Ndi nile ndi nāchu ya chukuru ya n'ebe di nkpà.
4Uzọ nile nke Zaion nēru újú, n'ihi na ọ dighi ndi nābia na mb͕e akara àkà;
Ọnu-uzọ-ama-ya nile tọb͕ọrọ n'efu; ndi-nchu-àjà-ya nēze ume:
5Ndi nākpab͕u ya aghọwo ndi-isi, ndi-iro-ya nọ n'udo;
N'ihi na Jehova emekpawo ya aru n'ihi iba-uba nke njehie-ya nile:
Umu-ntakiri-ya alawo dika ndi adọtara n'agha n'iru onye-nkpab͕u.
6Ima-nma-ya nile esiwo kwa n'aru ada Zaion pua:
Ndi-isi-ya aghọwo ele nke nāchọtaghi ebe-ita-nri,
Ha we je ije nēnweghi ike n'iru onye nāchu ha.
7Jerusalem echetawo n'ubọchi nile nke nweda-n'ala-ya na nke nwaghari-ya nile
Ihe nile ya anāchọsi ike nke diri site n'ubọchi nile nke mb͕e ochie:
Mb͕e ndi-ya dabàra n'aka onye-nkpab͕u, ma ọ dighi onye nēyere ya aka,
Ndi-nkpab͕u huru ya, ha chìri nkwusi-ya nile ọchì.
8Jerusalem emehiewo nke-uku; n'ihi nka ka ọ ghọworo ihe ruru árú:
Ndi nile ndi nāsọpuru ya-ri elelìwo ya anya, n'ihi na ha ahuwo ọtọ-ya:
E, ya onwe-ya ezewo ume, we chigharia azu.
9Ọrurú-ya di n'ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-ya; o chetaghi ikpe-azu-ya;
O we rida n'uzọ di ebube; ọ dighi onye-nkasi-obi o nwere:
Jehova, le nweda-n'alam; n'ihi na onye-iro emewo onwe-ya ka ọ di uku.
10Onye-nkpab͕u ab͕asawo aka-ya n'elu ihe-utọ nile nke Jerusalem:
N'ihi na ọ huwo na mba di iche iche abatawo n'ebe nsọ ya,
Bú ndi I nyere iwu bayere ha na ha agaghi-abà nime nkpọkọta I nwere.
11Ndi-ya nile nēze ume, ha nāchọ nri;
Ha enyewo ihe nile ha anāchọsi ike n'ọnọdu ihe-oriri iweghachi nkpuru-obi:
Le, Jehova, legide anya; n'ihi na aghọwom ihe jọb͕uru onwe-ya.
12Ọ̀ bughi unu ihe, unu nile ndi nāgabiga n'uzọ?
Legidenu, hu ma ọ di ihe-nb͕u dika ihe-nb͕um di, bú nke anēme mu,
Onye Jehova mekpaworo aru n'ubọchi iwe-Ya di ọku.
13N'elu ka O siri zite ọku n'ọkpukpum nile, o we nwe ike n'aru ha:
Ọ b͕asaworo ukwum abua ub͕u, O mewo ka m'laghachi azu;
O mewom ka m'ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na onye aru nādighi ike ogologo ubọchi nile.
14Aka-Ya ekewo yoke nke njehiem nile;
Akpakọwo ha n'otù, ha arigotawo n'olum; O mewo ka ikem su ngọngọ:
Onye-nwe-ayi enyewom n'aka-ha, bú ndi m'nāpughi iguzosi ike megide.
15Onye-nwe-ayi eledawo ndim nile di ebube anya n'etitim:
Ọ kpọsawo mb͕e akara àkà imegidem itipia umu-okorọbiam:
Ebe-nzọcha-nkpuru-vine ka Onye-nwe-ayi zọchaworo nye ada Juda nāmaghi nwoke.
16N'ihi ihe ndia ka mu onwem nākwa ákwá; anyam, anyam nērùda miri;
N'ihi na onye-nkasi-obi nke nēweghachi nkpuru-obim di anya n'ebe m'nọ;
Umum tọb͕ọrọ n'efu, n'ihi na onye-iro di ike.
17Zaion ab͕asawo aka-ya abua; ọ dighi onye-nkasi-obi o nwere;
Jehova enyewo iwu bayere Jekob, na ndi nọ ya buruburu gābu ndi nākpab͕u ya:
Jerusalem aghọwo ihe-isọ-nsọ n'etiti ha.
18Onye ezi omume ka Jehova bu; n'ihi na okwu-ọnu-Ya ka m'nupuworo isi megide:
Biko, nurunu, unu ndi nile di iche iche, le-kwa-nu ihe-nb͕um:
Umu-ab͕ọghọm nāmaghi nwoke na umu-okorọbiam alawo n'etiti ndi adọtara n'agha.
19Akpọkurum ndi nāhum n'anya, ma ha onwe-ha ghọb͕urum:
Ndi-nchu-àjàm na ndi-okenyem kubìri ume n'obodom,
Mb͕e ha nāchọrọ onwe-ha ihe-oriri ka ha we weghachi nkpuru-obi-ha.
20Le, Jehova; n'ihi na ahuhu dirim; ngiri-afọm nānum ọku;
Obim nātughari nimem; n'ihi na enupuwom isi nke-uku:
N'èzí mma-agha ab͕abawom aka nwa, n'ulo ihe dika ọnwu di.
21Ha anuwo na onye nēze ume ka m'bu; ọ dighi onye-nkasi-obi m'nwere;
Ndi-irom nile anuwo ihe ọjọm; obi atọwo ha utọ na Gi onwe-gi emewo ya:
I gēme ka ọ bia, bú ubọchi I kpọsaworo, ha ewe di ka mu onwem.
22Ka ihe ọjọ nile ha bia n'iru Gi;
Gi me kwa ha, dika I meworom n'ihi njehiem nile:
N'ihi na ize-umem di ọtutu, aru adighi kwa obim ike.

Currently Selected:

ABÙ-ÁKWÁ 1: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy