YouVersion Logo
Search Icon

JỌN 7

7
1Mb͕e ihe ndia gasiri Jisus we nējeghari na Galili: n'ihi na Ọ chọghi ijeghari na Judia, n'ihi na ndi-Ju nāchọ uzọ ib͕u Ya. 2Ma ememe ahu nke ndi-Ju, bú ememe ulo-ikwū, di nso. 3Ya mere umu-nne-Ya siri Ya, Si n'ebe a pua, je na Judia, ka ndi nēso uzọ-Gi we hu kwa ọlu-Gi nile nke I nālu. 4N'ihi na ọ dighi onye ọ bula nēme ihe ọ bula na nzuzo, ma asi na ya onwe-ya nāchọ ka ọra madu mara ya. Ọ buru na I nēme ihe ndia, me Onwe-gi ka I puta ìhè nye uwa. 5N'ihi na ọbuná umu-nne-Ya ekweghi na Ya. 6Ya mere Jisus si ha, oge nkem akērughi; ma oge nke unu bu ihe edoziworo mb͕e nile. 7Uwa apughi ikpọ unu asì; ma ọ nākpọ Mu onwem asì, n'ihi na Mu onwem nāb͕ara ya àmà, na ọlu-ya nile jọrọ njọ. 8Rigonu onwe-unu n'ememe a: Mu onwem agaghi-arigoro ememe a ub͕u a; n'ihi na oge nkem akēzughi. 9Ma mb͕e Ọ gwasiri ha okwu ndia, Ọ nānọgide na Galili.
10Ma mb͕e umu-nne-Ya rigosiri ememe ahu, mb͕e ahu Ya onwe-ya rigo-kwa-ra, ọ bughi n'iru ọra madu, kama dika ọ bu na nzuzo. 11Ya mere ndi-Ju nāchọ Ya n'ememe, nāsi, Òle ebe Onye ahu nọ? 12Oké ntamu di kwa n'etiti ìgwè madu nile bayere Ya: ufọdu nāsi, Ọ bu ezi madu; ndi ọzọ nāsi, É-è, kama Ọ nēduhie ìgwè madu a. 13Otú ọ di, ọ dighi onye ọ bula nēkwuwa okwu bayere Ya n'ihi egwu ndi-Ju.
14Ma mb͕e o ruru n'etiti ememe ahu ub͕u a Jisus rigoro n'ulo uku Chineke, we nēzí ihe. 15Ya mere o nēju ndi-Ju anya, ha si, Onye a, Ò si aṅa mata akwukwọ ri nne, n'ebe ọ dighi mb͕e Ọ muworo akwukwọ? 16Ya mere Jisus zara ha, si, Ozizím abughi nkem, kama ọ bu nke Onye ziterem. 17Ọ buru na onye ọ bula achọ ime ihe Ọ nāchọ, ọ gāmara ihe ozizí a bu, ma o sitere n'aka Chineke, ma-ọbu na Mu onwem nēkwu site n'Onwem. 18Onye nēkwu site n'onwe-ya nāchọ otuto nke aka ya: ma onye nāchọ otuto nke onye zitere ya, onye ahu bu onye ezi-okwu, ajọ omume adighi kwa nime ya. 19Ọ̀ bughi Moses nyere unu iwu-unu, ma ọ dighi onye ọ bula nime unu nēme iwu ahu? Gini mere unu nāchọ uzọ ib͕um? 20Ìgwè madu ahu zara, si, I nwere mọ ọjọ: ònye nāchọ uzọ ib͕u Gi? 21Jisus zara, si ha, Otù ọlu ka M'luru, o we nēju unu nile anya. 22Ọ bu n'ihi nka ka Moses nyere unu ibì-úgwù (ọ bughi na o sitere n'aka Moses, kama o sitere n'aka nna-ayi-hà); n'ubọchi-izu-ike unu nēbì kwa madu úgwù. 23Ọ buru na ebì madu úgwù n'ubọchi-izu-ike, ka ewe ghara imebi iwu Moses; ùnu nwere òlùlù ọjọ n'arum, n'ihi na emerem ka aru dichasia otù madu nma n'ubọchi-izu-ike? 24Unu elela iru kpe ikpé, kama nēkpenu ikpé ziri ezi.
25Ya mere ufọdu nime ndi Jerusalem siri, Onye a, Ọ̀ bughi Onye ha nāchọ uzọ ib͕u? 26Ma le, Ọ nēkwuwa okwu, ma ha agwaghi Ya okwu ọ bula. Ọ̀ gābu na ndi-isi mara n'ezie na Onye a bu Kraist-ayi? 27Otú ọ di ayi matara Onye a ebe O si puta: ma mb͕e ọ bula Kraist-ayi gābia, ọ dighi onye ọ bula mara ebe O si puta. 28Ya mere Jisus tiri nkpu n'ulo uku Chineke, nēzí ihe, nāsi kwa, Unu mataram, mata kwa ebe M'si puta; ọ bughi kwa n'Onwem ka M'biaworo, kama Onye ziterem bu ezi Onye, Nke unu onwe-unu nāmataghi. 29Mu onwem matara Ya; n'ihi na esim n'ebe Ọ nọ bia, Ya onwe-ya zite-kwa-ram. 30Ya mere ha chọrọ uzọ ijide Ya: ọ dighi kwa onye ọ bula tukwasiri Ya aka, n'ihi na oge hour Ya akābiaghi. 31Ma n'etiti ìgwè madu ahu ọtutu kwere na Ya; ha nāsi kwa, Mb͕e ọ bula Kraist-ayi gābia, Ọ̀ gēme ihe-iriba-ama kari nke Onye a mere? 32Ndi-Farisi nuru ìgwè madu ahu ka ha nātamu ntamu ndia bayere Ya; ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi we ziga ndi nējere ha ozi ka ha jide Ya. 33Ya mere Jisus siri, Ọ fọduru nwa oge Mu na unu gānọ, M'we lakuru Onye ziterem. 34Unu gāchọm, ma unu agaghi-achọtam: ebe Mu onwem nọ kwa, unu onwe-unu apughi ibia. 35Ya mere ndi-Ju siritara onwe-ha, Òle ebe Onye a gaje iga na ayi onwe-ayi agaghi-achọta Ya? Ọ̀ gaje igakuru ndi b͕asara n'etiti ndi-Grik na izí ndi-Grik ihe? 36Gini bu okwu a nke O kwuru, si, Unu gāchọm, ma unu agaghi-achọtam: ebe Mu onwem nọ kwa, unu onwe-unu apughi ibia?
37Ma n'ubọchi ikpe-azu, bú oké ubọchi nke ememe ahu, Jisus guzoro, we tie nkpu, si, Ọ buru na akpiri kpọrọ madu ọ bula nku, ya biakutem, ṅua miri. 38Onye nēkwere na Mu, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ kwuru, n'afọ-ya ka osimiri nke miri di ndu gēsi nērùputa. 39Ma nka ka O kwuru bayere Mọ Nsọ, Nke ndi kwere na Ya gaje inara: n'ihi na akēnyeghi Mọ Nsọ; n'ihi na akēnyeghi Jisus otuto. 40Ya mere ufọdu nime ìgwè madu ahu, mb͕e ha nuru okwu ndia, ha si, N'ezie Onye a bu onye-amuma ahu. 41Ndi ọzọ nāsi, Onye a bu Kraist-ayi. Ma ufọdu nāsi, Gini, ọ̀ gābu na Galili ka Kraist-ayi si bia? 42Àkwukwọ nsọ ekwughi na Kraist-ayi nēsi na nkpuru Devid bia, site kwa na Betlehem, bú obodo ntá ebe Devid nọri? 43Ya mere nkewa putara n'etiti ìgwè madu ahu n'ihi Ya. 44Ma ufọdu nime ha chọrọ ijide Ya; ma ọ dighi onye ọ bula tukwasiri Ya aka.
45Ya mere ndi ahu ndi nēje ozi biakutere ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi; ndi ahu we si ha, N'ìhi gini ka unu nēkutaghi Ya? 46Ndi ahu ndi nēje ozi zara, si, Ọ dighi mb͕e ọ bula madu kwuru okwu di otú a. 47Ya mere ndi-Farisi zara ha, si, Èduhiewo kwa unu onwe-unu? 48Ọ̀ di onye ọ bula n'etiti ndi-isi, ma-ọbu n'etiti ndi-Farisi, kwere na Ya? 49Ma ìgwè madu a nke nāmaghi iwu-ayi bu ndi anābu ọnu. 50Nikọdimọs si ha (onye biakutere Ya na mbu, ebe ọ bu otù onye nime ha), 51Ìwu-ayi nēkpe madu ikpé, ọ buru na o bughi uzọ nu n'ọnu-ya, we mara ihe ọ nēme? 52Ha zara, si ya, Gì onwe-gi si kwa na Galili puta? Nyocha n'akwukwọ nsọ, le kwa na ọ dighi onye-amuma si na Galili bilie.
53Ha nile we la, onye ọ bula n'ulo nke aka ya:

Currently Selected:

JỌN 7: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy