YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ ỌMA 129

129
Abú Nrigo.
1Ọtutu mb͕e ka ha kpab͕uworom site na mb͕e m'di na nwata,
Biko, ka Israel kwue otú a, si,
2Ọtutu mb͕e ka ha kpab͕uworom site na mb͕e m'di na nwata:
Ma otú ọ di, ha apughi imegidem.
3N'elu azum ka ndi-plough jiri plough gwu dika esi egwu ala-ubi;
Ha mere ka furrow nile ha di ogologo.
4Jehova bu onye ezi omume:
O bipuwo udọ̀ nile nke ndi nēmebi iwu.
5Ka ihere me ha, ka ha laghachi kwa azu,
Bú ndi nile nākpọ Zaion asì.
6Ka ha di ka ahihia nēpú n'elu ulo,
Nke nākpọnwu mgbe o puputara:
7Nke onye nēwe ihe-ubi nējighi kpojue ọbu-aka-ya,
Onye nēhie ùkwù-ọka nējighi kwa ya kpojue obi-ya.
8Ọzọ, ndi nāgabiga asighi,
Ka ngọzi Jehova diri unu;
Ayi agọziwo unu n'aha Jehova.

Currently Selected:

ABÙ ỌMA 129: IGBOB

Highlight

Copy

Compare

Share

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in